Nwa agbọghọ nwụrụ anwụ na nwanyị onye ọrịa
40 Mgbe Jisọs lọghachiri, igwe mmadụ nabatara ya nʼihi na ha niile na-eche ya. 41 Mgbe ahụ otu nwoke nke aha ya bụ Jairọs, onye bụ onyeisi nʼụlọ ekpere, bịara daa nʼala nʼụkwụ Jisọs na-arịọ ya ka ọ bịa nʼụlọ ya. 42 Nʼihi na otu nwata nwanyị ọ mụtara naanị ya, nke gbara afọ iri na abụọ nọ nʼọnụ ọnwụ.
Mgbe ọ na-aga, igwe mmadụ ahụ na-akpagbu ya. 43 Ọ dị otu nwanyị nʼetiti ha nke nọrịị na-arịa ọrịa oruru ọbara afọ iri na abụọ, onye mefuru ihe niile o ji nʼaka ndị dibịa, ma ọ dịghị onye nwere ike ịgwọ ya. 44 O sitere nʼazụ ya metụ ọnụ uwe ya aka. Ngwangwa, ọrịa oruru ọbara ahụ kwụsịkwara.
45 Jisọs sịrị, "Onye metụrụ m aka?"
Mgbe ọ na-enweghị onye pụtara kwuo sị na ọ bụ ya. Pita gwara ya sị, "Nna anyị ukwu, igwe mmadụ gbara gị gburugburu na-adakwasịkwa gị."
46 Ma Jisọs sịrị, "Otu onye metụrụ m aka; amatara m na ike esitela nʼime m pụọ."
47 Mgbe nwanyị ahụ hụrụ na ọ dịkwaghị ihe o nwere ike ime iji zoo onwe ya, o ji ịma jijiji bịa daa nʼụkwụ ya. Nʼihu mmadụ niile, ọ kọrọ ihe mere o ji metụ ya aka na otu e sị gwọọ ya nʼotu ntabi anya. 48 Ọ gwara ya sị, "Ada m nwanyị, okwukwe gị agwọọla gị. Laa nʼudo."
49 Mgbe ọ ka nọ na-ekwu okwu, otu onye si nʼụlọ Jairọs bụ onyeisi ụlọ ekpere, bịara sị, "Ada gị nwanyị anwụọla, enyekwala onye ozizi nsogbu ọzọ."
50 Ma mgbe Jisọs nụrụ ozi a, ọ zara ya sị, "Atụla egwu, naanị kwere, a ga-agwọkwa ya."
51 Mgbe o rutere nʼụlọ Jairọs, o kweghị ka onye ọbụla soro ya baa nʼime ụlọ ahụ ma ọ bụghị naanị Pita, Jọn, Jemis, nne na nna nwata ahụ. 52 Nʼoge ahụ, ha niile nọ na-ebe akwa na-eru ụjụ maka nwata ahụ. Ọ sịrị ha, "Unu ebezila akwa, nʼihi na ọ nwụghị anwụ kama ọ nọ nʼụra."
53 Ha chịrị ya ọchị, nʼihi na ha matara na ọ nwụrụ anwụ. 54 Ma o jidere ya nʼaka, sị, "Nwa m, bilie!" 55 Mmụọ ya lọghachiri, o bilitekwara mgbe ahụ. Ọ gwakwara ha ka ha chọọrọ ya nri ka o rie. 56 Ihe a gbara ndị mụrụ ya gharịị ma ọ nyere ha iwu ka ha ghara ịkọrọ onye ọbụla ihe mere.