Pular para o conteúdo
Publicidade

Luk 8

Nwa agbọghọ nwụrụ anwụ na nwanyị onye ọrịa

40 Mgbe Jisọs lọghachiri, igwe mmadụ nabatara ya nʼihi na ha niile na-eche ya. 41 Mgbe ahụ otu nwoke nke aha ya bụ Jairọs, onye bụ onyeisi nʼụlọ ekpere, bịara daa nʼala nʼụkwụ Jisọs na-arịọ ya ka bịa nʼụlọ ya. 42 Nʼihi na otu nwata nwanyị mụtara naanị ya, nke gbara afọ iri na abụọ nọ nʼọnụ ọnwụ.

Mgbe na-aga, igwe mmadụ ahụ na-akpagbu ya. 43 dị otu nwanyị nʼetiti ha nke nọrịị na-arịa ọrịa oruru ọbara afọ iri na abụọ, onye mefuru ihe niile o ji nʼaka ndị dibịa, ma dịghị onye nwere ike ịgwọ ya. 44 O sitere nʼazụ ya metụ ọnụ uwe ya aka. Ngwangwa, ọrịa oruru ọbara ahụ kwụsịkwara.

45 Jisọs sịrị, "Onye metụrụ m aka?"

Mgbe na-enweghị onye pụtara kwuo sị na bụ ya. Pita gwara ya sị, "Nna anyị ukwu, igwe mmadụ gbara gị gburugburu na-adakwasịkwa gị."

46 Ma Jisọs sịrị, "Otu onye metụrụ m aka; amatara m na ike esitela nʼime m pụọ."

47 Mgbe nwanyị ahụ hụrụ na dịkwaghị ihe o nwere ike ime iji zoo onwe ya, o ji ịma jijiji bịa daa nʼụkwụ ya. Nʼihu mmadụ niile, kọrọ ihe mere o ji metụ ya aka na otu e sị gwọọ ya nʼotu ntabi anya. 48 gwara ya sị, "Ada m nwanyị, okwukwe gị agwọọla gị. Laa nʼudo."

49 Mgbe ka nọ na-ekwu okwu, otu onye si nʼụlọ Jairọs bụ onyeisi ụlọ ekpere, bịara sị, "Ada gị nwanyị anwụọla, enyekwala onye ozizi nsogbu ọzọ."

50 Ma mgbe Jisọs nụrụ ozi a, zara ya sị, "Atụla egwu, naanị kwere, a ga-agwọkwa ya."

51 Mgbe o rutere nʼụlọ Jairọs, o kweghị ka onye ọbụla soro ya baa nʼime ụlọ ahụ ma bụghị naanị Pita, Jọn, Jemis, nne na nna nwata ahụ. 52 Nʼoge ahụ, ha niile nọ na-ebe akwa na-eru ụjụ maka nwata ahụ. sịrị ha, "Unu ebezila akwa, nʼihi na nwụghị anwụ kama nọ nʼụra."

53 Ha chịrị ya ọchị, nʼihi na ha matara na nwụrụ anwụ. 54 Ma o jidere ya nʼaka, sị, "Nwa m, bilie!" 55 Mmụọ ya lọghachiri, o bilitekwara mgbe ahụ. gwakwara ha ka ha chọọrọ ya nri ka o rie. 56 Ihe a gbara ndị mụrụ ya gharịị ma nyere ha iwu ka ha ghara ịkọrọ onye ọbụla ihe mere.

Veja também