Pular para o conteúdo
Publicidade

Lucas 9

Jisọs enye puku mmadụ ise nri

10 Mgbe ndị ozi a lọtara, ha kọọrọ ya ihe niile ha mere. kpọọrọ ha gaa nʼobodo a na-akpọ Betsaida ebe ha ga-anọ naanị ha. 11 Ma mgbe igwe mmadụ matara nke a, ha sooro ya. nabatara ha ma gwakwa ha okwu maka alaeze Chineke. gwọkwara ndị niile dị mkpa na-emere ka ahụ dị ha mma.

12 Mgbe anwụ bidoro ịda, ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ bịakwutere ya sị ya, "Zilaga igwe mmadụ a ka ha gaa nʼime obodo na nʼobodo nta ndị gbara ebe a gburugburu, ka ha chọtara onwe ha nri na ebe ndina nʼihi na ebe a anyị nọ bụ ọzara."

13 zara ha sị, "Unu nye ha nri ka ha rie."

Ha zaghachiri ya sị, "Anyị nwere naanị ogbe achịcha ise na azụ abụọ. Ma bụghị na anyị ga aga zụọra mmadụ ndị a niile nri." 14 Ndị nọ nʼebe ahụ ruru puku ndị nwoke ise.

gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, "Meenụ ka ha nọdụ ala nʼigwe nʼigwe, iri mmadụ ise, iri mmadụ ise." 15 Ha mere otu ahụ, mee ka ha niile nọdụ ala. 16 O weere ogbe achịcha ise na azụ abụọ ndị ahụ, lelie anya nʼeluigwe, gọzie ma nyawaa ha, nye ndị na-eso ụzọ ya ka ha keere igwe mmadụ ahụ. 17 Ha niile riri rijuokwa afọ, a tụtụkọtara ihe fọdụrụ, tụtụjuo nkata iri na abụọ nʼiberibe achịcha fọdụrụ.

Veja também