Jisọs emee ka ifufe kwụsị
35 Nʼụbọchị ahụ nʼoge uhuruchi, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, "Ka anyị gafee nʼofe nke ọzọ." 36 Ha hapụrụ igwe mmadụ ahụ ma kpọrọ ya, otu ọ dị, ya na ha banyere nʼime ụgbọ. Ụgbọ ndị ọzọ dịkwa na-eso ya. 37 Oke ifufe dị ike bidoro ife, ebili mmiri na-awụbakwa nʼụgbọ ahụ ruo na ụgbọ ha fọdụrụ ntakịrị ka mmiri mie ya. 38 Ma Jisọs nọ nʼazụ azụ ụgbọ ahụ na-arahụ ụra nʼelu ohiri isi. Ndị na-eso ụzọ ya kpọtere ya sị ya, "Onye ozizi, o metụghị gị nʼobi na anyị nʼala nʼiyi?"
39 Ọ biliri ọtọ, baara ifufe ahụ mba sịkwa osimiri ahụ, "Kwụsị! Dere jii!" Ifufe ahụ kwụsịrị, ebe niile dajụrụ deere jii.
40 Ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, "Gịnị mere unu ji atụ oke egwu? Ọ bụ na unu enwebeghị okwukwe?"
41 Ha niile tụrụ egwu, jụrịta onwe ha sị, "Onye bụ onye a? Ọ bụladị ifufe na ebili mmiri na-erubere ya isi!"