Pular para o conteúdo
Publicidade

Marcos 4

Jisọs emee ka ifufe kwụsị

35 Nʼụbọchị ahụ nʼoge uhuruchi, gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, "Ka anyị gafee nʼofe nke ọzọ." 36 Ha hapụrụ igwe mmadụ ahụ ma kpọrọ ya, otu dị, ya na ha banyere nʼime ụgbọ. Ụgbọ ndị ọzọ dịkwa na-eso ya. 37 Oke ifufe dị ike bidoro ife, ebili mmiri na-awụbakwa nʼụgbọ ahụ ruo na ụgbọ ha fọdụrụ ntakịrị ka mmiri mie ya. 38 Ma Jisọs nọ nʼazụ azụ ụgbọ ahụ na-arahụ ụra nʼelu ohiri isi. Ndị na-eso ụzọ ya kpọtere ya sị ya, "Onye ozizi, o metụghị gị nʼobi na anyị nʼala nʼiyi?"

39 biliri ọtọ, baara ifufe ahụ mba sịkwa osimiri ahụ, "Kwụsị! Dere jii!" Ifufe ahụ kwụsịrị, ebe niile dajụrụ deere jii.

40 sịrị ndị na-eso ụzọ ya, "Gịnị mere unu ji atụ oke egwu? bụ na unu enwebeghị okwukwe?"

41 Ha niile tụrụ egwu, jụrịta onwe ha sị, "Onye bụ onye a? bụladị ifufe na ebili mmiri na-erubere ya isi!"

Veja também