Pular para o conteúdo
Publicidade

Marcos 5

Jisọs agwọọ nwoke mmụọ ọjọọ bi nʼime ya

1 Ha gafere nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ nʼakụkụ obodo Gerazin.5:1 Nʼakwụkwọ ochie ụfọdụ, ị nwere ike hụ Gadarin. 2 Mgbe Jisọs sitere nʼụgbọ ahụ pụta, otu nwoke mmụọ na-adịghị ọcha si nʼebe a na-eli ozu bịa zute ya. 3 Nwoke a bi nʼetiti ili ndị ahụ. dịkwaghị onye ọbụla pụrụ ike ya agbụ, bụladị iji eriri igwe kee ya. 4 Nʼihi na e keela ya agbụ ụkwụ nʼaka ọtụtụ oge ma dọbisiri eriri igwe ndị ahụ, gbajisiekwa mkpọrọ igwe dị ya nʼụkwụ. dịkwaghị onye nwere ike ijideli ya. 5 na-agagharị nʼetiti ili ahụ ehihie na abalị na nʼugwu dị ya gburugburu, na-eti mkpu, na-eji nkume dị nkọ na-egbukasị onwe ya ahụ.

6 Mgbe o sitere nʼebe dị anya hụ Jisọs, gbaara ọsọ gaa gbuo ikpere nʼihu ya. 7 O tiri mkpu nʼoke olu sị, "Gịnị ka mụ na gị nwekọrọ, Jisọs, Ọkpara Chineke Onye kachasị ihe niile elu? Eji m aha Chineke na-arịọ gị, biko, atala m ahụhụ." 8 Nʼihi na o nyela ya iwu sị, "Si nʼime nwoke a pụta, gị mmụọ na-adịghị ọcha!"

9 Mgbe ahụ Jisọs jụrụ ya sị, "Gịnị bụ aha gị?"

Mmụọ ọjọọ ahụ zaghachiri ya sị, "Aha m bụ Lijiọn,5:9 Nke a bụ site na puku atọ ruo puku isii nʼọnụọgụgụ. nʼihi na anyị dị ọtụtụ." 10 Ma rịọsiri ya arịrịọ ike ka ghara ịchụpụ ha site nʼobodo ahụ.

11 Igwe ezi nọ nso nʼebe ahụ na-akpa nri, na ndịda ugwu dị nʼebe ahụ. 12 Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ ya sị, "Biko ziga anyị nʼetiti igwe ezi ndị a, ma hapụ anyị ka anyị banye nʼime ha." 13 hapụrụ ha; mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha pụtara baa nʼime igwe ezi ndị ahụ. Igwe ezi ahụ niile, ọnụọgụgụ ha ruru puku abụọ, gbaara ọsọ site na mkputamkpu ala ọnụ mmiri dakpuo nʼime osimiri ebe mmiri riri ha niile.

14 Ndị na-elekọta igwe ezi ahụ gbaara ọsọ laa, kọsaa ihe mere nʼime obodo nakwa nʼala ahụ niile. Nʼihi nke a, ọtụtụ mmadụ pụtara ilere ihe mere.

Veja também