Pular para o conteúdo
Publicidade

Mak 5

35 Mgbe ka nọ na-ekwu okwu, ụfọdụ ndị mmadụ sitere nʼụlọ onyeisi ụlọ ekpere bịara sị, "Ada gị nwanyị anwụọla, olee ihe mere i ji esogbu onye ozizi a ọzọ?"

36 Ma ka nụrụ ihe ha kwuru, Jisọs gwara onyeisi ụlọ ekpere ahụ sị ya, "Atụla egwu, naanị kwere."

37 O kweghị ka onye ọbụla ọzọ soro ya ma bụghị Pita, na Jemis na Jọn nwanne Jemis. 38 Mgbe ha bịarutere nʼụlọ onyendu ụlọ ekpere ahụ, nụrụ ụzụ hụkwa ọtụtụ mmadụ ka ha nọ na-akwa akwa na-etikwa mkpu akwa. 39 Mgbe batara, sịrị ha, "Gịnị mere unu ji na-akwa akwa na-etikwa mkpu akwa? Nwatakịrị a anwụghị anwụ, na-arahụ ụra!" 40 Ma ha chịrị ya ọchị.

Mgbe chụpụsịrị ha niile nʼezi, kpọọrọ nne na nna nwantakịrị ahụ, na ndị ya na ha so, banye nʼime ụlọ ebe nwantakịrị ahụ dina. 41 O jidere ya nʼaka sị ya, "Talita koum!" (nke pụtara, "Nwa agbọghọ nta, asị m gị bilie!"). 42 Otu mgbe ahụ nwaagbọghọ nta ahụ biliri ọtọ bido ijegharị (gbara afọ iri na abụọ). Nke a jụrụ ha niile anya nke ukwuu. 43 Ma dọsiri ha aka na ntị ike, ka ha ghara ịgwa onye ọbụla ihe mere. sịrị ha, "Nyenụ ya nri ka o rie."

Veja também