22 Mgbe ada Herodịas bịara tee egwu, obi tọrọ Herọd na ndị niile ọ kpọrọ oriri ụtọ.
Eze gwara nwaagbọghọ ahụ sị, "Rịọ m ihe ọbụla ị chọrọ aga m enyekwa gị ya." 23 O kwere ya nkwa ṅụọkwa iyi sị, "Ihe ọbụla ị rịọrọ m aga m enye gị, ọ bụladị ọkara alaeze m."
24 Ọ jekwuru nne ya jụọ ya sị, "Gịnị ka m ga-arịọ?"
Ọ zara ya sị, "Isi Jọn omee baptizim."
25 Ngwangwa, ọ bịakwutere eze rịọ ya sị, "Achọrọ m ka i nye m, ugbu a, nʼime efere, isi Jọn omee baptizim."
26 O wutere eze nke ukwuu, ma nʼihi iyi ọ ṅụrụ, na nʼihi ndị ọ kpọrọ oriri, ọ chọghị ịjụ inye ya ihe ọ rịọrọ ya. 27 Ngwangwa o zipụrụ onye agha na-eche nche nye ya iwu ka ọ gaa bute isi Jọn. Ọ gara, bipụ isi Jọn nʼụlọ mkpọrọ, 28 tinye isi ahụ nʼime efere butere nwaagbọghọ ahụ onye nara ya bunye nne ya.