35 Nʼoge a, ọchịchịrị ebidola ịgba, nʼihi ya, ndị na-eso ụzọ ya bịara gwa ya, "Ebe a bụ ọzara, chi ejiekwala. 36 Zilaga ndị a, ka ha gaa nʼobodo nta ndị dị gburugburu ebe a, zụtara onwe ha ihe ha ga-eri."
37 Ma ọ zara sị ha, "Nyenụ ha ihe ha ga-eri."
Ha sịrị ya, "Anyị ga-eje ịzụta ogbe achịcha nke narị denarị6:37 Otu denarị bụ ihe a na-akwụ dị ka ụgwọ ọrụ otu ụbọchị. abụọ, iji nye ha ka ha rie?"
38 Ma ọ jụrụ ha sị, "Ogbe achịcha ole ka unu nwere? Gaanụ chọpụta."
Mgbe ha chọpụtasịrị, ha sịrị, "Ogbe achịcha ise na azụ abụọ."
39 Mgbe ahụ o nyere ha iwu ka ha mee igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nʼotu nʼotu nʼelu ahịhịa ndụ. 40 Ya mere, ha nọdụrụ ala, iri mmadụ ise nʼotu ebe, narị mmadụ nʼebe ọzọ. 41 Ọ naara ogbe achịcha ise na azụ abụọ ndị ahụ, welie anya ya elu, nye ekele. Ọ nyawara achịcha ahụ nye ya ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee ndị mmadụ ahụ. Otu aka ahụkwa ọ nyawakwara azụ abụọ ahụ nyekwa ha niile. 42 Ha niile riri rijuo afọ. 43 Ha tụtụkọtara iberibe achịcha na azụ tụtụjuo nkata iri na abụọ. 44 Ọnụọgụgụ ndị nwoke riri ogbe achịcha ahụ dị puku mmadụ ise.