Pular para o conteúdo
Publicidade

Marcos 7

Okwukwe nwanyị Siria

24 hapụrụ ebe ahụ gaa nʼakụkụ obodo Taịa.7:24 Nʼakwụkwọ ochie ụfọdụ i ga-ahụ Taịa na Saịdọn. Nʼebe ahụ banyere nʼime otu ụlọ. Ma o nwekwaghị ike izo onwe ya, nʼagbanyeghị na chọghị ka a mata na nọ ebe ahụ. 25 Ngwangwa, otu nwanyị nwere otu nwa nwanyị ntakịrị nke mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya nụrụ maka ya, bịara daa nʼụkwụ ya. 26 Nwanyị a bụ onye Griik a mụrụ nʼakụkụ Sairo-Fonisia. rịọrọ ya ka chụpụrụ ya mmụọ ọjọọ ahụ bi nʼime nwa ya nwanyị.

27 sịrị ya, "Hapụ ka ụmụntakịrị buru ụzọ rie ihe, nʼihi na o zighị ezi na a ga-ewere nri ụmụntakịrị tụpụrụ nkịta."

28 Ma zaghachiri ya sị, "Onyenwe m, ma ụmụ nkịta na-erikwa iberibe nri ụmụntakịrị si na tebul tụpụ nʼala."

29 Mgbe ahụ, sịrị ya, "Nwanyị, zara nke ọma, nʼihi ọsịsa gị, laa, mmụọ ọjọọ ahụ ahapụla nwa gị nwanyị ugbu a."

30 laghachiri nʼụlọ ya, hụ nwantakịrị ahụ ka o dina nʼelu ihe ndina, mmụọ ọjọọ ahụ apụọkwala.

Veja também