Pular para o conteúdo
Publicidade

Mak 7

9 Ma gwakwara ha sị, "Unu nwere ụzọ dị mma nʼanya unu nke unu ji wezuga iwu Chineke ma were omenaala unu dochie nʼọnọdụ ya. 10 Nʼihi na Mosis sịrị, Sọpụrụ nne gị na nna gị,7:10 Ọpụ 20:12; Dit 5:16 na, onye ọbụla kwujọrọ nne maọbụ nna ya ka e gbuo ya.7:10 Ọpụ 21:17; Lev 20:9 11 Ma unu na-asị, na bụrụ na mmadụ asị nne ya maọbụ nna ya, Ihe ọbụla bụ nke gara erite nʼaka m bụ kọban,(nke pụtara onyinye dịrị Chineke).7:11 Nke a adịghị nʼiwu Chineke nyere. 12 Nʼụzọ dị otu a, unu na-akwagide ndị mmadụ ka ha hapụ inyere nne na nna ha aka. 13 Nʼụzọ dị otu a, unu na-eme okwu Chineke ka bụrụ ihe efu, site nʼomenaala unu nke unu nyefere nʼaka ndị ọzọ. dịkwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị ka nke a unu na-eme."

Veja também