Josef anabata Jisọs dịka nwa ya nwoke
18 Otu a ka ọmụmụ Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst1:18 Maọbụ, Onye nzọpụta siri dị: Nne ya Meri bụ onye e kwenyere na ọ ga-alụ Josef, ma tupu ha ebikọọ ọnụ a chọpụtara na Meri di ime site na Mmụọ Nsọ. 19 Ma Josef di ya bụ onye ezi omume, ọ chọghị imenye ya ihere, nʼihi ya, o zubere ịchụ ya na nzuzo.
20 Mgbe Josef nwechara mkpebi a, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere ya na nrọ sị ya, "Josef nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye gị, nʼihi na nwa ahụ ọ dị ime ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ. 21 Ọ ga-amụkwa nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jisọs,1:21 Jisọs nke a bụ otu ndị Griik si akpọ Joshua nke pụtara Onyenwe anyị na-azọpụta. nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nke ya site na mmehie ha."