Publicidade

Mateus 1

Josef anabata Jisọs dịka nwa ya nwoke

18 Otu a ka ọmụmụ Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst1:18 Maọbụ, Onye nzọpụta siri dị: Nne ya Meri bụ onye e kwenyere na ga-alụ Josef, ma tupu ha ebikọọ ọnụ a chọpụtara na Meri di ime site na Mmụọ Nsọ. 19 Ma Josef di ya bụ onye ezi omume, chọghị imenye ya ihere, nʼihi ya, o zubere ịchụ ya na nzuzo.

20 Mgbe Josef nwechara mkpebi a, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere ya na nrọ sị ya, "Josef nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Meri ka bụrụ nwunye gị, nʼihi na nwa ahụ dị ime ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ. 21 ga-amụkwa nwa nwoke, onye ga-akpọ aha ya Jisọs,1:21 Jisọs nke a bụ otu ndị Griik si akpọ Joshua nke pụtara Onyenwe anyị na-azọpụta. nʼihi na ga-azọpụta ndị nke ya site na mmehie ha."

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-