20 Mgbe Josef nwechara mkpebi a, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere ya na nrọ sị ya, "Josef nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye gị, nʼihi na nwa ahụ ọ dị ime ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ. 21 Ọ ga-amụkwa nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jisọs,1:21 Jisọs nke a bụ otu ndị Griik si akpọ Joshua nke pụtara Onyenwe anyị na-azọpụta. nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nke ya site na mmehie ha."
22 Ihe ndị a mere iji mezuo ihe ahụ Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onye amụma ya sị, 23 "Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ha ga-akpọ aha ya Ịmanụel"1:23 Aịz 7:14 (nke bụ ma asụgharịa ya, "Chineke nọnyeere anyị").
24 Mgbe Josef si nʼụra teta, o mere dịka mmụọ ozi Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. Ọ kpọọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye ya. 25 Ma ha abụọ edinakọghị tutu ruo mgbe ọ mụsịrị nwa nwoke, onye ọ kpọrọ aha ya Jisọs.