Abụmọnụ nye obodo ndị na-ekwenyeghị
20 Mgbe ahụ ọ bidoro ịbụ obodo niile ebe ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube ọnụ, nʼihi na obodo ndị a echegharịghị. 21 "Ahụhụ ga-adịrị gị Korazin. Ahụhụ ga-adịkwara gị Betsaida. Nʼihi na a sị na ọ bụ nʼime Taịa na Saịdọn ka a rụrụ ọrụ ebube niile a rụrụ nʼime unu, ha gaara echegharị ma gosikwa nchegharị ha site nʼiyi uwe mkpe na ikpokwasị onwe ha ntụ nʼisi. 22 Nʼezie asị m unu na ọ ga-adịrị unu njọ nʼụbọchị ikpe ahụ karịa obodo Taịa na Saịdọn. 23 Ma gị Kapanọm bụ obodo a na-asọpụrụ, a ga-ebuli gị elu ruo eluigwe? Mba, ị ga-arịdaru ọkụ ala mmụọ. Nʼihi na a sị na a rụrụ ọrụ ebube m rụrụ nʼime gị nʼobodo Sọdọm, a garaghị ala ya nʼiyi. Ọ gaara adịrị ruo taa. 24 Nʼezie asị m unu, ọ ga-adịrị unu njọ nʼụbọchị ikpe ahụ karịa obodo Sọdọm."