Pular para o conteúdo
Publicidade

Matiu 14

Jisọs agaa ije nʼelu mmiri

22 Mgbe nke a gasịrị, gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha banye nʼụgbọ malite ịgafe ofe ọzọ nke osimiri ahụ. Ma ya onwe ya nọdụrụ maka izilaga ndị mmadụ ahụ. 23 Mgbe zilagasịrị igwe mmadụ ahụ, rigooro nʼelu ugwu ikpe ekpere, naanị ya. Mgbe oge anyasị ruru, naanị ya nọkwa na-ebe ahụ. 24 Ma nʼoge a ụgbọ mmiri ahụ esitela nʼebe ala dị nso gamie nʼelu osimiri, ebili mmiri na-ebugharịkwa ya, nʼihi na ifufe ahụ na-emegide ya.

25 Ma ihe dị ka site nʼelekere atọ ruo elekere isii nke ụtụtụ, Jisọs bịakwutere ha, na-aga ije nʼelu osimiri. 26 Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ya ka na-aga ije nʼelu osimiri ahụ, obi lọrọ ha mmiri, ha sị, "bụkwanụ mmụọ o!" Ha tiri mkpu nʼihi egwu.

27 Ma ngwangwa Jisọs sịrị ha, "Nweenụ obi ike! O bụ m; unu atụla egwu."

28 Pita zara ya, "Onyenwe anyị, bụrụ na bụ gị, sị m bịakwute gị nʼelu mmiri."

29 sịrị ya, "Bịa!"

Pita sitere nʼụgbọ ahụ pụta, bido ịga ije nʼelu mmiri ijekwuru Jisọs. 30 Ma mgbe hụrụ oke ebili mmiri ahụ ka na-amagharị; egwu tụrụ ya. Ma mgbe malitere imikpu nʼime mmiri ahụ, o tiri mkpu sị, "Onyenwe m! Zọpụta m!"

31 Na-atụfughị oge, Jisọs setịpụrụ aka ya dọpụta Pita. sịrị ya, "Gị onye okwukwe nta, nʼihi gịnị ka i ji nwee obi abụọ!"

32 Ma mgbe ha rịbanyere nʼime ụgbọ ahụ ifufe ahụ kwụsịkwara. 33 Ndị ahụ nọ nʼụgbọ ahụ kpọrọ isiala nye ya sị, "Nʼezie, bụ Ọkpara Chineke."

Veja também