Pular para o conteúdo
Publicidade

Mateus 15

Okwukwe nwanyị Kena

21 Jisọs hapụrụ obodo ahụ gaa nʼakụkụ obodo Taịa na Saịdọn. 22 Nʼebe ahụ, otu nwanyị onye Kenan bi nʼobodo ahụ bịakwutere ya rịọọ ya sị, "Onyenwe m, nwa Devid, biko meere m ebere. Ada m nwanyị nwere ajọ mmụọ nʼime ya nke na-esogbu ya oge niile."

23 Ma gbara ya nkịtị. Emesịa ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya rịọ ya sị ya, "Chụlaa nwanyị a! Lee ka o si eti mkpu na-esogharị anyị!"

24 zara sị, "Ezitere m naanị ijekwuru atụrụ furu efu nke ụlọ Izrel."

25 Ma bịara daa nʼụkwụ ya rịọọ ya sị, "Onyenwe m, nyere m aka!"

26 zara sị, "O zighị ezi na a ga-ewere nri ụmụntakịrị tụpụrụ nkịta."

27 zara sị, "bụ eziokwu Onyenwe m. Ma a na-ekwekwa ka ụmụ nkịta nọ nʼokpuru tebul rie iberibe nri nke na-esi nʼelu tebul ha daa nʼala."

28 Jisọs zara sị ya, "Nwanyị, okwukwe gị dị ukwuu! Laa, e meelara gị ihe na-arịọ." Nʼotu oge ahụ a gwọrọ ada ya.

Veja também