Pular para o conteúdo
Publicidade

Matiu 15

3 zara ha sị, "Gịnị mere unu ji na-ada iwu Chineke nʼihi omenaala unu? 4 Nʼihi na Chineke sịrị, Sọpụrụ nne gị na nna gị,15:4 Ọpụ 20:12; Dit 5:16 na, onye ọbụla kwujọrọ nna maọbụ nne ya ka e gbuo ya.15:4 Onye ahụ aghaghị ịnwụ15:4 Ọpụ 21:17; Lev 20:9 5 Ma unu na-asị, bụrụ na onye ọbụla ga-asị nna maọbụ nne ya, ihe ọbụla bụ nke gara erite nʼaka m bụ onyinye dịrị Chineke. 6 Nʼihi ya, ha agaghị eji ya asọpụrụ nna ha maọbụ nne ha. Nʼụzọ dị otu a, unu na-eme ka okwu Chineke bụrụ ihe efu nʼihi omenaala unu. 7 Ndị ihu abụọ! Amụma ahụ Aịzaya buru banyere unu bụ eziokwu. Mgbe o kwuru sị,

8 " Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m,

ma obi ha dị anya nʼebe m nọ.

9 Ofufe ha na-efe m bụ ihe efu, 15:9 Ịkpọ isiala ha bụ ihe efu.

ozizi ha bụkwa ihe mmadụ nyere nʼiwu. 15:9 Aịz 29:13 "

Veja também