Pular para o conteúdo
Publicidade

Mateus 15

Jisọs enye puku mmadụ anọ nri

32 Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, "Ana m emere igwe mmadụ ndị a obi ebere, nʼihi na mụ na ha anọọla ụbọchị atọ nʼebe a, ma ha eribeghị nri ọbụla. Agaghị m ezilaga ha na-erighị nri, nʼihi na ha nwere ike ịda nʼụzọ."

33 Ndị na-eso ụzọ ya sịrị, "Ebee ka anyị ga-enweta nri ga-ezuru igwe mmadụ ndị a nʼọzara a?"

34 Jisọs jụrụ ha sị, "Ogbe achịcha ole ka unu nwere?"

Ha sịrị ya, "Ogbe achịcha asaa na azụ ole na ole."

35 gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala. 36 O weere ogbe achịcha asaa na azụ ole na ole ahụ kelee Chineke ekele. nyawasịrị ha, nye ndị na-eso ụzọ ya. Ndị na-eso ụzọ ya nyekwara igwe mmadụ ahụ. 37 Onye ọbụla nʼime ha riri, rijuo afọ. Ndị na-eso ụzọ ya tụtụkọtara iberibe ndị fọdụrụ nke juru nkata asaa. 38 Ndị riri nri ahụ dị puku ụmụ nwoke anọ, nʼagụnyeghị ndị nwanyị na ụmụntakịrị.

Veja também