15 Ọ jụrụ ha sị, "Ma unu onwe unu, ọ bụ onye ka unu na-asị na m bụ?"
16 Saimọn Pita zara sị ya, "Ị bụ Kraịst16:16 Maọbụ, Onye nzọpụta ahụ, Ọkpara Chineke dị ndụ."
17 Jisọs gwara ya sị, "Saimọn Pita nwa Jona, ị bụ onye a gọziri agọzi, nʼihi na anụ ahụ na ọbara ekpugheghị ya nye gị. Kama, ọ bụ Nna m bi nʼeluigwe mere ka ị mata ya.