Ịtụ ụtụ ụlọnsọ ukwu
24 Mgbe ha bịaruru na Kapanọm, ndị na-ana ụtụ nʼihi ụlọnsọ17:24 Didrakma abụọ bụ ọnụ ego ụtụ ụlọnsọ. bịakwutere Pita jụọ ya sị, "Onye ozizi unu ọ dịghị atụ ụtụ ụlọnsọ?"
25 Pita zara ha sị, "E, ọ na-atụ ụtụ."
Mgbe ọ batara nʼụlọ, Jisọs buru ụzọ jụọ ya sị, "Gịnị ka i chere banyere nke a Saimọn? Ọ bụ nʼaka ndị ole ka ndị eze ụwa si anakọta ụtụ taks? Ọ bụ nʼaka ụmụ ha, ka ọ bụ nʼaka ndị ọbịa?"
26 Ma mgbe Pita zara ya sị, "Ọ bụ site nʼaka ndị ọbịa."
Jisọs sịrị ya, "Ọ dị mma. Iwu ejighị ndị bụ ụmụ. 27 Ma otu ọ dị, achọghị m ka anyị mee ka iwe wee ha. Gaa nʼosimiri ahụ tụnye nko azụ gị nʼime ya. Meghe ọnụ azụ mbụ ị ga-egbute. Ị ga-ahụ otu mkpụrụ ego nʼime ọnụ ya. Were ya nye ha, ka ọ bụrụ ụtụ nke mụ na gị."