Publicidade

Mateus 18

Mkpa dị inwe obi mgbaghara

21 Mgbe ahụ Pita bịakwutere ya jụọ ya ajụjụ sị, "Onyenwe anyị, bụ ugboro ole ka m ga-agbaghara nwanne m nke mehiere megide m? bụ ugboro asaa?"

22 Jisọs zara sị ya, "bụghị ugboro asaa. Kama ga-agbaghara ya ruo iri ugboro asaa ụzọ asaa.

23 "A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere eze ahụ kpebiri ka ya na ndị ọrụ ya gụzie ego ya ha ji. 24 Mgbe ha malitere na-apịazi, a kpọtaara eze ahụ otu onye nke ji ya ụgwọ ruru puku talenti iri. 25 Nwoke ahụ enweghị ihe ga-eji kwụọ ụgwọ o ji. Nna ya ukwu nyere iwu ka e refuo ya na nwunye ya na ụmụ ya, na ihe niile o nwere, ka akwụghachi ụgwọ o ji.

26 "Ma ohu ahụ dara nʼala, gbukwaa ikpere ya nʼala, rịọ ya arịrịọ sị, Onyenwe m, biko, nwee ntachiobi nʼebe m nọ. Aga m akwụghachikwa gị ụgwọ niile m ji gị. 27 Nna ukwu onye ọrụ ahụ nwere ọmịiko nʼebe nọ, meere ya ebere. sịrị ya akwụghachila ụgwọ o ji ọzọ.

28 "Ma mgbe ohu ahụ sitere nʼebe ahụ pụọ, hụrụ otu ohu ibe ya ji ya ụgwọ otu narị denarị. O jidere ya nʼaka ike, machie ya aka nʼakpịrị, sị ya, Kwụghachi m ụgwọ i ji m ugbu a.

29 "Ya mere, ohu ibe ya ahụ dara nʼala nʼihu ya rịọọ ya ka o nye ya nwantịntị oge. rịọkwara ya sị, Enyi m, biko nwee ntachiobi, aga m akwụghachi gị ụgwọ m ji gị.

30 "Ma o kwenyeghị, kama gara tụba ya nʼụlọ mkpọrọ, ebe ga-anọ ruo mgbe kwụsịrị ụgwọ niile o ji ya. 31 Mgbe ndị ohu ibe ya hụrụ ihe mere, o wutere ha nke ukwuu. Ha jekwuru Nna ha ukwu kọọrọ ya ihe niile ndị a.

32 "Nʼihi nke a Nna ya ukwu kpọrọ ohu ahụ sị ya, Ohu obi ọjọọ! Agbaghara m gị ụgwọ ahụ niile i ji, nʼihi na rịọrọ m arịrịọ. 33 bụ na kwesighị inwe obi ebere nʼebe ohu ibe gị nọ, dị ka m si mere gị ebere? 34 Nʼihi iwe, Nna ya ukwuu nyefere ya nʼaka ndị nche na-eche ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ ka ha taa ya ahụhụ, ruo mgbe kwụchara ụgwọ niile o ji.

35 "Otu a ka Nna m bi nʼeluigwe ga-emekwa unu, ma bụrụ na unu ejighị obi unu niile gbaghara ụmụnna unu."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-28_14-13-17-