Pular para o conteúdo
Publicidade

Mateus 19

Jisọs agọzie ụmụntakịrị

13 Mgbe ahụ e kuteere ya ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka, kpeekwara ha ekpere. Ma ndị na-eso ụzọ ya baara ndị kutere ha mba.

14 Ma Jisọs sịrị ha, "Kweenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m, unu egbochikwala ha. Nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ndị dị otu a." 15 O bikwasịrị ha aka nʼisi gọzie ha niile tupu hapụ ha pụọ.

Veja também