23 Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, "Nʼezie agwa m unu, ọ bụ nnọọ ihe siri ike na onye ọgaranya ga-abanye nʼalaeze eluigwe. 24 Ọzọkwa, asị m unu, ọ dịịrị ịnyịnya kamel mfe ịgafe nʼanya agịga, karịa ọgaranya ịbanye nʼalaeze Chineke."
25 Okwu a o kwuru tụrụ ndị na-eso ụzọ ya nʼanya. Ha sịrị, "Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, onye kwanụ ka a ga-azọpụta?"
26 Jisọs legidere ha anya sị ha, "Nʼebe mmadụ nọ nke a bụ ihe a na-apụghị ime, ma ọ dịghị ihe rara ahụ ime nʼebe Chineke nọ."