Pular para o conteúdo
Publicidade

Mateus 2

Ọbịbịa ndị amamihe

1 Mgbe a mụchara Jisọs na Betlehem nke Judịa nʼoge Herọd bụ eze, ndị amamihe si ọwụwa anyanwụ bịaruru Jerusalem, 2 na-ajụ ajụjụ sị, "Olee ebe nọ, bụ onye a mụrụ ịbụ eze ndị Juu? Anyị hụrụ kpakpando ya2:2 Kpakpando ya mgbe ọ walitere nʼọwụwa anyanwụ, ma bịa ịkpọ isiala nye ya."

3 Mgbe eze Herọd nụrụ nke a, obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu, ya na ndị niile bi na Jerusalem. 4 Mgbe kpọkọtara ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu niile, jụrụ ha, olee ebe e kwuru na a ga-amụ Kraịst2:4 Maọbụ, Onye nzọpụta ahụ. 5 Ha zara ya sị, "Na Betlehem nke Judịa. Nʼihi na otu a ka onye amụma ahụ dere nʼakwụkwọ sị,

6 " Ma gị onwe gị, Betlehem, dị nʼala Juda,

dịghị nta karịchasịa nʼetiti ndị ọchịchị Juda,

nʼihi na bụ site na gị ka onye ọchịchị ga-esi pụta,

onye ga-achị ndị nke m Izrel.2:6 Mai 5:2"

7 Mgbe ahụ Herọd kpọrọ ndị amamihe ahụ na nzuzo jụpụta ha banyere oge kpakpando ahụ ji pụta ìhè. 8 O zipụrụ ha ije Betlehem sị ha, "Gaanụ lee anya nke ọma chọpụta ebe nwantakịrị ahụ nọ. Mgbe unu chọtara ya, bịanụ mee ka m mara, ka m gaakwa kpọọ isiala nye ya."

9 Mgbe ha nụrụ okwu eze, ha pụrụ gawa, ma kpakpando ahụ ha hụrụ nʼọwụwa anyanwụ pụtakwara ọzọ, na-aga nʼihu ha ruo mgbe bịara guzo nʼelu ebe nwantakịrị ahụ nọ. 10 Ha ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu mgbe ha hụrụ kpakpando ahụ. 11 Ka ha banyere nʼụlọ ahụ, ha hụrụ nwantakịrị ahụ na nne ya Meri, ha gburu ikpere nʼala ma kpọọrọ ya isiala. Ha meghere akpa akụ ha nye ya onyinye ọlaedo na ọkpụrụkpụ eso osisi na-esi isi ụtọ a na-akpọ frankisens,2:11 Maọbụ, mgbaisiọma ya na máá.2:11 Maọbụ, mgba ilu 12 Nʼihi na a dọrọ ha aka na ntị na nrọ ka ha ghara ịlaghachikwuru Herọd, ha sitere nʼụzọ ọzọ laghachi obodo ha.

Veja também