Pular para o conteúdo
Publicidade

Mateus 2

3 Mgbe eze Herọd nụrụ nke a, obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu, ya na ndị niile bi na Jerusalem. 4 Mgbe kpọkọtara ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu niile, jụrụ ha, olee ebe e kwuru na a ga-amụ Kraịst2:4 Maọbụ, Onye nzọpụta ahụ. 5 Ha zara ya sị, "Na Betlehem nke Judịa. Nʼihi na otu a ka onye amụma ahụ dere nʼakwụkwọ sị,

6 " Ma gị onwe gị, Betlehem, dị nʼala Juda,

dịghị nta karịchasịa nʼetiti ndị ọchịchị Juda,

nʼihi na bụ site na gị ka onye ọchịchị ga-esi pụta,

onye ga-achị ndị nke m Izrel.2:6 Mai 5:2"

7 Mgbe ahụ Herọd kpọrọ ndị amamihe ahụ na nzuzo jụpụta ha banyere oge kpakpando ahụ ji pụta ìhè. 8 O zipụrụ ha ije Betlehem sị ha, "Gaanụ lee anya nke ọma chọpụta ebe nwantakịrị ahụ nọ. Mgbe unu chọtara ya, bịanụ mee ka m mara, ka m gaakwa kpọọ isiala nye ya."

Veja também