Pular para o conteúdo
Publicidade

Mateus 21

Mbata ikpeazụ Jisọs batara Jerusalem

1 Mgbe ha na-abịaru Jerusalem nso, ha rutere Betfeji dị nʼUgwu Oliv. Jisọs zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya. 2 gwara ha sị, "Baanụ nʼime obodo nta ahụ dị unu nʼihu, ngwangwa unu ga-ahụ otu ịnyịnya ibu elibere nʼosisi nʼebe ahụ, nke ya na nwa ya nọ nʼotu ebe. Tọpụta ha ma kpụtaranụ m ha. 3 bụrụkwa na onye ọbụla asị unu ihe ọbụla, unu ga-asị ha, dị Onyenwe anyị mkpa, ga-akpụghachitekwa ha ngwangwa."

4 E mere nke a ka okwu e kwuru site nʼọnụ onye amụma mezuo.

5 "Gwanụ ada Zayọn sị,

lee, eze gị ka na-abịakwute gị.

bụ onye dị nwayọọ. na-anọkwasịkwa nʼelu ịnyịnya ibu,

ee, nʼelu nwa ịnyịnya, nwa ịnyịnya na-ebu ibu.’ "21:5 Zek 9:9

6 Ndị na-eso ụzọ ya gara mee ihe Jisọs sịrị ha mee. 7 Ha kpụtara ịnyịnya ibu ahụ na nwa ịnyịnya ahụ, wụkwasịkwa uwe ha nʼelu ha ka Jisọs nọkwasị nʼelu ha. 8 Ọtụtụ nʼime igwe mmadụ ahụ tụsara uwe ha nʼokporoụzọ. Ndị ọzọ gbuturu alaka osisi, tụsaa ha nʼụzọ nʼihu ya. 9 Ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ nọ nʼihu, na ndị na-esokwa nʼazụ, nọ na-eti mkpu nʼoke olu na-asị:

"Hozanna dịrị Nwa Devid!"

"Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!"21:9 Abụ 118:26

"Hozanna nʼebe kachasị ihe niile elu!"

10 Mgbe batara nʼime Jerusalem, ụzụ tụrụ, obodo ahụ niile mere mkpọtụ. Ndị mmadụ bidoro na-ajụ ajụjụ na-asị, "Onye kwa bụ onye a?"

11 Igwe mmadụ ahụ nọ na-asị, "Nwoke a bụ Jisọs, onye amụma ahụ sị Nazaret, obodo dị nʼime Galili."

Veja também