17 Ugbu a gwa anyị, gịnị bụ uche gị? O ziri ezi nʼiwu ịtụ ụtụ nye Siza, ka ọ bụ na o zighị ezi?"
18 Ebe Jisọs maara ihe ọjọọ ha bu nʼobi, ọ zara sị ha, "Ndị ihu abụọ! Gịnị mere unu ji anwa m ọnwụnwa? 19 Gosinụ m ego e ji akwụ ụgwọ ụtụ." Ha wetaara ya otu mkpụrụ ego. 20 Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, "Onye ka e sekwasịrị onyinyo ya nʼelu ego a? Aha onye kwa dị nʼokpuru onyinyo a?"
21 Ha zara sị ya, "Ọ bụ nke Siza."
Mgbe ahụ ọ gwara ha sị, "Ọ dị mma. Nyenụ Siza ihe ruuru Siza, ma nyekwanụ Chineke ihe niile bụ nke ruuru Chineke."