Ọ dị mkpa ịnọ na nche
45 "Onye bụ ohu ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi ma nwekwa uche, nke onyenwe ya mere onyeisi ndị ohu nọ nʼezinaụlọ ya, ka ọ na-enye ha nri nʼoge ya? 46 Ngọzị na-adịrị ohu ahụ, onye, mgbe onyenwe ya ga-alọghachi hụ na ọ na-eme otu a. 47 Nʼezie asị m unu, ọ ga-eme ya onyeisi nke ihe niile o nwere. 48 Ma ọ bụrụ na ohu ahụ bụ onye ajọọ omume na-asị onwe ya,24:48 Maọbụ, na-asị nʼobi ya ‘Nna m ukwu anọọla ogologo oge,’ 49 ọ bụrụkwa na o bido iti ndị ohu ibe ya ihe, sorokwa ndị ọṅụ oke mmanya na-eri, na-aṅụ. 50 Nna ukwu ohu ahụ ga-alọta nʼụbọchị ọ na-atụghị anya, nʼoge awa ọ na-amakwaghị. 51 Ọ ga-egburisikwa ya, nye ya ọnọdụ nʼetiti ebe ndị ihu abụọ nọ. Ebe e nwere ịkwa akwa na ịta ikikere eze.