Pular para o conteúdo
Publicidade

Mateus 25

Ijizi akụ

14 "Ọzọ, ga-adị ka otu nwoke chọrọ ịga njem. kpọkọtara ndị ohu ya niile nyefee ha akụnụba ya nʼaka. 15 O nyere onye nke mbụ talenti ise, nke abụọ ka o nyere talenti abụọ. O nyere onye nke ikpeazụ otu talenti.25:15 Talenti Otu talenti bụ ụgwọ ọnwa iri afọ abụọ nke onye Griik na-arụ ọrụ ụbọchị. O nyere ha nʼotu nʼotu dị ka ike ha ha. Mgbe ahụ hapụrụ ha gaa ije ya. 16 Onye ahụ natara talenti ise weere ego ahụ malite ịzụ ahịa. Ngwangwa o retara talenti ise ọzọ nʼuru. 17 Otu a kwa, onye nke e nyere talenti abụọ zụpụtakwara talenti abụọ ọzọ nʼuru. 18 Ma onye ahụ natara otu talenti gara gwuo ala lie ego nna ya ukwu, nʼihi ichezi ya nke ọma.

19 "Mgbe ogologo oge gasịrị, nna ukwu ndị ohu ahụ lọtara site nʼije ya. kpọkọtara ha niile ka ha gụzie akụ ya. 20 Onye ahụ natara talenti ise batara wetakwa ise ọzọ. gwara nna ya ukwu sị, nyere m talenti ise, ma ugbu a azụpụtala m talenti ise ọzọ!

21 "Nna ya ukwu sịrị ya, I mere nke ọma ezi ohu kwesiri ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị. Nʼihi ya aga m etinye gị nʼebe ga-elekọta ọtụtụ ihe. Bata nʼọṅụ nke nna gị ukwu.

22 "Onye nke e nyere talenti abụọ bịara sị, Nna anyị ukwu, i nyere m talenti abụọ, ma lee, eritala m talenti abụọ ọzọ nʼuru.

23 "Nna ya ukwu sịrị ya, I mere nke ọma. bụ ezi ohu kwesiri ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị. Nʼihi ya aga m etinye gị nʼebe ga-elekọta ọtụtụ ihe. Bata nʼọṅụ nke nna gị ukwu.

24 "Onye e nyere otu talenti batara sị, Nna anyị ukwu, amaara m onye bụ. bụ onye aka ntagide. na-ewe ihe ubi nʼebe na-akụghị mkpụrụ. na-achịkọtakwa nʼebe na-agbasaghị. 25 Nʼihi nke a, atụrụ m egwu, a gara m liere gị ego talenti gị nʼala. Lee ihe gị werekwa.

26 "Nna ya ukwu zara ya sị, Ohu ọjọọ na onye umengwụ. maara na m na-ewe ihe ubi nʼebe m na-akụghị mkpụrụ, na-achịkọtakwa nʼebe m na-agbasaghị. 27 gaara etinye ego m nʼaka ndị na-echekwa ego, ndị gaara akwụghachi ya na ọmụrụnwa ya, nke m gaara anata mgbe m lọghachiri.

28 " Napụtanụ ya talenti ahụ o ji, were ya nye onye ji talenti iri. 29 Nʼihi na onye ọbụla nwere ka a ga e tinyekwuru ka o nwebigakwa oke. Ma onye ahụ na-adịghị nke o nwere, a ga-anapụ ya bụladị nke nta o nwere. 30 Tụpụnụ ohu a na-abaghị uru nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.

Veja também