1 Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, 2 "Dị ka unu maara nke ọma, Mmemme Ngabiga ga-amalite mgbe ụbọchị abụọ gasịrị. Nʼoge ahụ, a ga-ararakwa Nwa nke Mmadụ nye ka a kpọgide ya nʼobe."
3 Nʼoge ahụ, ndịisi nchụaja, na ndị okenye zukọtara nʼụlọeze otu onyeisi nchụaja a na-akpọ Kaịfas. 4 Ha gbara izu ịchọpụta ụzọ ha ga-esi jide Jisọs na nzuzo gbuo ya. 5 Ha kwekọrịta sị, "Ọ gaghị abụ nʼoge mmemme ka ọgbaaghara hapụ ịdị nʼetiti ndị mmadụ."
6 Mgbe Jisọs nọ na Betani, nʼụlọ Saimọn onye ekpenta, 7 otu nwanyị bu karama alabasta nke mmanụ otite isi ụtọ dị oke ọnụahịa dị nʼime ya, bịakwutere ya, nke ọ wụsara ya nʼisi dị ka ọ na-anọdụ ala nʼeri nri.
8 Ma mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, iwe were ha nke ukwuu. Ha sịrị, "Olee ụdị ịla nʼiyi dị nke a! 9 A gaara erepụta mmanụ a ego dị ukwuu were ego e retara ya nyere ndị ogbenye aka."
10 Ebe Jisọs matara ihe ha na-atamu nʼobi ha, ọ sịrị ha, "Gịnị mere unu ji esogbu nwanyị a? O merela m ihe dị mma. 11 Unu na ndị ogbenye ga-anọ oge niile, ma ọ bụghị mụ na unu ga-anọ mgbe niile. 12 Nʼihi na site nʼịwụ m mmanụ otite a nʼahụ, o doziela m maka olili. 13 Nʼezie, ana m agwa unu, nʼebe ọbụla ezisara oziọma a nʼụwa niile, a ga na-echeta nwanyị a nʼihi ihe ọma a o meere m."
14 Mgbe ahụ otu nʼime mmadụ iri na abụọ na-eso ụzọ ya, onye aha ya bụ Judas Iskarịọt, jekwuuru ndịisi nchụaja. 15 Ọ jụrụ ha sị, "Gịnị ka unu ga-enye m ma m rara ya nye nʼaka unu?" Ha kwụrụ ya iri mkpụrụ ọlaọcha atọ. 16 Site nʼoge ahụ na-aga, ọ chọrọ ohere ịrara ya nye nʼaka ha.
17 Nʼụbọchị mbụ nke mmemme achịcha na-ekoghị eko, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya jụọ ya sị, "Ebee ka ị chọrọ ka anyị gaa kwadoro gị ihe gị maka oriri Ngabiga?"
18 Ọ zara ha sị, "Jekwurunụ otu nwoke nʼime obodo sị ya, Onye ozizi sị, ‘Oge m abịala nso. Mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-eri oriri Ngabiga nʼụlọ gị.’ " 19 Ndị na-eso ụzọ ya mere dị ka Jisọs gwara ha, doziekwa oriri Ngabiga ahụ nʼebe ahụ.
20 Nʼuhuruchi ụbọchị ahụ, ya na ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ ahụ nọdụrụ ala nʼoche nri ahụ. 21 Mgbe ha na-eri nri, o kwuru sị, "Nʼezie ana m agwa unu, na otu onye nʼime unu ga-arara m nye."
22 Ha nwere oke mwute, ma malite ịjụ ya nʼotu nʼotu sị, "Onyenwe anyị, ọ bụ m?"
23 Ma ọ zara ha sị, "Ọ bụ onye ahụ mụ na ya na-amanyekọta aka nʼotu efere ga-arara m nye. 24 Lee Nwa nke Mmadụ ga-ala dị ka e si buo ya nʼamụma. Ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ onye a ga-esite nʼaka ya rara Nwa nke Mmadụ nye. Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ."
25 Judas, onye ahụ raara ya nye jụrụ ya sị, "Onye ozizi ọ bụ m?"
Ọ zara sị, "Gị onwe gị ekwuola ya."
26 Mgbe ha nọkwa na-eri nri, Jisọs were ogbe achịcha ahụ, mgbe o nyechara ekele, ọ nyawara ya nye ndị na-eso ụzọ ya sị ha, "Naranụ nke a rie, nʼihi na nke a bụ anụ ahụ m."
27 Mgbe ahụ kwa, o burukwara iko mmanya, ma mgbe o nyechara ekele, o bunyere ya ndị na-eso ụzọ ya sị ha, "Unu niile ṅụọnụ site nʼiko a. 28 Nʼihi na nke a bụ ọbara m nke bụ akara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. A na-awụsa ya maka ọtụtụ mgbaghara mmehie.