Ọnwụ Judas
3 Mgbe Judas, onye ahụ rara Jisọs nye, hụrụ na a maala Jisọs ikpe ọnwụ, o chegharịrị weghachikwara ndịisi nchụaja na ndị okenye iri ego ọlaọcha atọ ahụ. 4 Ọ kwuru sị, "Emehiela m, site na ịrara onye aka ya dị ọcha nye ọnwụ."
Ma ha sịrị, "Nke ahụ agbasaghị anyị, ọ bụ mkpa dịrị gị."