33 Mgbe ha bịarutere nʼebe a na-akpọ Gọlgọta (nke pụtara, "ebe okpokoro isi"). 34 Ha nyere ya mmanya a gwara ọgwụ ilu ka ọ ṅụọ. Mgbe o detụrụ ya ire, o kweghị ya ọṅụṅụ. 35 Mgbe ha kpọgidechara ya nʼelu obe. Ha fere nza nke ha jiri kee uwe ya nʼetiti onwe ha.27:35 Imezu ihe e dere nʼAbụ Ọma 22:18.