16 Ngwangwa e mechara Jisọs baptizim, o sitere na mmiri ahụ rịpụta. Nʼotu oge ahụ, eluigwe meghere, Jọn hụrụ Mmụọ nke Chineke ka o si nʼelu fedata dị ka nduru na-ebekwasị Jisọs nʼisi. 17 Otu olu sitere nʼeluigwe kwuo okwu sị, "Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya. Ihe ya dị m ezi mma."
Publicidade
Publicidade