Ọkpụkpọ ndị na-eso ụzọ ya
18 Ma mgbe Jisọs na-agafe nʼakụkụ osimiri Galili, ọ hụrụ ụmụnne abụọ, Saimọn onye a na-akpọ Pita, na Andru nwanne ya, ndị ọrụ ha bụ ịkụ azụ, ebe ha nọ nʼụgbọ mmiri na-akụ azụ. 19 Ọ sịrị ha, "Bịanụ soro m. Aga m eme unu ndị ọkụ na-akụta mmadụ." 20 Ha hapụrụ ụgbụ azụ ha otu mgbe ahụ soro ya.
21 Mgbe ọ gara nʼihu nke nta, ọ hụrụ ụmụnne abụọ ọzọ, Jemis nwa Zebedi na Jọn nwanne ya, ebe ha na nna ha Zebedi nọ nʼime ụgbọ mmiri na-ekezi ụgbụ azụ ha. Ọ kpọkwara ha, 22 ngwangwa ha hapụrụ ụgbọ ha na nna ha soro ya.