Pular para o conteúdo
Publicidade

Neemias 1

4 Mgbe m nụrụ okwu ndị a, anọdụrụ m ala kwaa nnọọ akwa. Nʼezie, ajụrụ m iri ihe ọbụla ọtụtụ ụbọchị, nʼihi na eji m oge m niile kpee ekpere rịọ Chineke nke eluigwe arịrịọ, 5 si ya:

"Gị, Onyenwe anyị Chineke nke eluigwe, onye dị ukwu na onye dịkwa egwu; gị onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya nke ndị ahụ hụrụ ya nʼanya na-edebekwa iwu ya niile. Biko nụrụ arịrịọ m. 6 Leda anya ebere gị ka nụrụ arịrịọ mụ bụ ohu gị na-arịọ gị ehihie na nʼabalị. Ana m ekwupụta mmehie anyị bụ ụmụ Izrel, ma nke m na ezinaụlọ nna m mere megide gị. 7 Anyị emela ihe jọrọ njọ megide gị. Anyị edebeghị iwu gị na ụkpụrụ gị nke i nyere ohu gị Mosis.

8 "Chetakwa ntụziaka inyere Mosis bụ ohu gị, na-asị, bụrụ na unu emehie, mụ onwe m ga-achụsa unu nʼetiti mba dị iche iche. 9 Ma bụrụ na unu alaghachikwute m, debe ihe niile m nyere unu nʼiwu, a sikwa na a chụsara unu mee ka unu gbasaa ga nʼakụkụ niile nke ụwa, aga m achịkọta unu mee ka unu laghachi na Jerusalem bụ obodo m họpụtara nye Aha m.

10 "Anyị bụ ndị ohu gị, bụrụkwa ndị i ji aka gị dị ike zọpụta. 11 Biko, Onyenwe anyị, nụrụ ekpere mụ bụ ohu gị, nụrụkwa ekpere ndị ohu gị niile na-atọ ụtọ ịtụ egwu aha gị. Mee ka ihe gara ohu gị nke ọma taa site nʼimere ya ebere nʼihu nwoke a.1:11 Eze a na-ekwu maka ya nʼebe bụ Ataksekses, Ezr 4:21"

Nʼoge ahụ abụ m onye na-ebu ihe ọṅụṅụ eze.

Veja também