Ndị iro
1 Iwe were Sanbalat nke ukwuu mgbe ọ nụrụ na anyị na-ewuzigharị mgbidi ahụ niile. O were iwe dị ọkụ, ọnụma jukwara ya obi. Ọ chịrị ndị Juu ọchị, kwaakwa ha emo. 2 Nʼihu ndị otu ya na ndịisi agha Sameria, o kwuru si, "Gịnị ka ndị Juu ole na ole a na-adịghị ike na-eme? Ha na-achọ iwugharị mgbidi obodo a? Ha ga-achụ aja? Ha ga-arụcha ọrụ niile nʼotu ụbọchị? Ha ga-esita nʼaja a kụpịasịrị akụpịa mee ka nkume ndị a dị ndụ, ka ọ bụ site na nkume ochie ndị a akpọrọ ọkụ?"
3 Tobaya onye Amọn, onye nọ ya nʼakụkụ mgbe ahụ, kwukwara okwu sị; "Leenụ ụdị mgbidi ha na-ewu! Ọ bụrụ na nkịta ọhịa arịkwasị ya nʼelu ọ ga-ada!"