5 Ndị Livayị ndị a, Jeshua, Kadmiel, Bani, Hashabneia, Sherebaya, Hodia, Shebanaya na Petahaya sịrị, "Bilienụ ọtọ, too Onyenwe anyị Chineke unu, onye na-adị site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi."
"Ka aha gị dị ebube bụrụ ihe a gọziri agọzi, ka ọ bụrụ ihe e buliri elu karịa ngọzị niile na otuto niile.