Pular para o conteúdo
Publicidade

Ọnụọgụgụ 14:1-9

Nnupu isi nke ụmụ Izrel

1 Nʼabalị ahụ, ọgbakọ Izrel niile weliri olu ha bido iti mkpu akwa. Ha kwagidere akwa a abalị niile. 2 Ndị Izrel niile tamuru ntamu megide Mosis na Erọn. Ọgbakọ ahụ niile sị ha, "Ọ gaara aka mma ma a sị na anyị nwụrụ nʼala Ijipt maọbụ nʼọzara a. 3 Gịnị mere Onyenwe anyị ji akpọbata anyị nʼala a ime ka anyị daa nʼihu mma agha. Ndị nwunye anyị na ụmụ anyị ga-aghọ ndị a dọtara nʼagha. Ọ garaghị akara anyị mma ịlaghachi azụ nʼIjipt?" 4 Ya mere ha kwekọrịtara nʼetiti onwe ha sị, "Ka anyị họpụtaranụ onwe anyị onyendu ga-edughachi anyị azụ nʼIjipt."

5 Mgbe ahụ, Mosis na Erọn dara kpuo ihu nʼala nʼihu ọgbakọ ndị Izrel niile zukọtara nʼebe ahụ. 6 Mmadụ abụọ nʼime ndị nledo ahụ, Joshua nwa Nun na Kaleb nwa Jefune, dọwara uwe14:6 Mgbe mmadụ dọwara uwe ya, nke a na-egosipụta ọnọdụ iru ụjụ na iwe. ha. 7 Ha gwara nzukọ Izrel sị, "Ala ahụ anyị gara ledoo anya bụ ala mara mma. 8 Ọ bụrụ na ihe banyere anyị na-atọ Onyenwe anyị ụtọ, ọ ga-edu anyị bata nʼala ahụ, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. 9 Unu enupukwala isi megide Onyenwe anyị. Unu atụkwala egwu ndị bi nʼime ala ahụ, nʼihi na anyị ga-emeri ha. Onyenwe anyị nọnyeere anyị. O wepụkwala aka nchebe ya nʼahụ ha. Unu atụla egwu ha."

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.