Pular para o conteúdo
Publicidade

Ndị Rom 13

Irubere ndị na-achị achị isi

1 Ka onye ọbụla doo onwe ya nʼokpuru ndị na-achị achị, nʼihi na ikike ọchịchị ọbụla agaghị adị ma bụrụ na Chineke akwadoghị ya. bụkwa Chineke tọrọ ntọala ikike ọchịchị niile e nwere. 2 Ya mere, onye ọbụla na-enupu isi nʼokpuru ọchịchị, na-emegide ihe Chineke hiwere, ndị na-eme nke a ga-ewetara onwe ha ikpe ọmụma. 3 Ndị na-eme ezi ihe anaghị atụ egwu ndị nọ nʼọchịchị, kama ndị na-atụ ha egwu bụ ndị na-eme ihe ọjọọ, ya mere bụrụ na chọghị ịtụ ndị na-achị achị egwu, mee ihe dị mma, ha ga-etokwa gị. 4 Nʼihi na bụ onyeozi Chineke maka ọdịmma nke gị, ma bụrụ na unu mere ihe na-adịghị mma, tụọnụ egwu, nʼihi na onye na-achị achị nwere ezi nkwado ịta onye mere ihe ọjọọ ahụhụ. bụ onyeozi Chineke bụrụkwa onye na-eji ọnụma na-ata ndị mmebi iwu ahụhụ. 5 Ya mere unu kwesiri irubere ndị na-achị achị isi, bụghị naanị maka ahụhụ dịrị ndị nnupu isi, kama nʼihi akọnuche.

6 bụkwa nke a kpatara unu ji na-atụ ụtụ isi nke taks, nʼihi na ndị na-achị achị na-ejere Chineke ozi mgbe ha na-aga nʼihu nʼezi ọchịchị. 7 Kwụghachinụ onye ọbụla ihe unu ji ha nʼụgwọ, bụrụ na unu ji ụgwọ ụtụ taks, kwụọnụ ya, bụrụkwa ụgwọ ụtụ isi nke akụnụba unu, ka unu ji, kwụọnụ ya. bụrụ na onye ọbụla kwesiri ka a sọpụrụ ya, sọpụrụnụ onye dị otu a, bụrụkwa na onye ọbụla kwesiri ka a kwanyere ya ugwu kwanyerenụ ya ugwu.

Veja também