Publicidade

Romanos 8

35 Onye nwere ike ikewapụ anyị site nʼịhụnanya Kraịst? bụ nsogbu, ka bụ ihe isi ike, ka bụ mkpagbu. Ka bụ ụnwụ, ka bụ ịgba ọtọ, ka bụ ihe egwu, ka bụ mma agha? 36 Dịka e dere ya,

"bụ nʼihi gị ka anyị na ọnwụ ji na-agba mgba ụbọchị niile.

A na-ele anyị anya dịka atụrụ a gaje igbu egbu."8:36 Abụ 44:22

37 Mba, kama nʼime ihe ndị a niile, anyị karịrị ndị mmeri site nʼonye ahụ hụrụ anyị nʼanya. 38 Nʼihi na nke a bụ ihe m maara nke ọma, na ọnwụ, maọbụ ndụ, maọbụ ndị mmụọ ozi, maọbụ mmụọ dị iche iche ndị na-achị nʼelu na nʼụwa, maọbụ ike ọchịchịrị dị iche iche, maọbụ ihe dị ugbu a, maọbụ ihe gaje ịbịa, 39 maọbụ ịdị elu, maọbụ ịdị omimi, ma bụkwanụ ihe ọbụla ọzọ e kere eke, agaghị enwe ike ikewapụ anyị site nʼịhụnanya Chineke, nke dị nʼime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-