Pular para o conteúdo
Publicidade

Rute 1

8 Mgbe ahụ, Naomi gwara ndị nwunye ụmụ ya abụọ okwu sị ha, "Ngwa, onye ọbụla nʼime unu laghachi nʼụlọ nne ya.1:8 Omenaala bụ na ndị ada na-alụbeghị di, na ndị ada di ha nwụrụ, na-ebinyere nne ha. Jen 24:28,67 Nʼakwụkwọ Rut isi abụọ, amaokwu nke iri na otu, e mere ka anyị mata na nna Rut ka dị ndụ. Ka Onyenwe anyị gosi unu obiọma dịka unu si gosi mụ onwe m, na ndị unu nwụrụ anwụ. 9 Ka Onyenwe anyị nyekwa unu di ọzọ ma meekwa ka unu chọta udo nʼezinaụlọ ọzọ."

Mgbe ahụ Naomi suturu ha ọnụ, ha niile kwara akwa. 10 Ma Ọpa na Rut zara Naomi sị ya, "E, anyị agaghị ala. Anyị ga-esoro gị laghachikwuru ndị gị."

11 Naomi zara sị ha, "Laghachinụ ụmụ m, bụ nʼihi gịnị ka unu ga-eji soro m laa? E nwere m ike ịmụta ụmụ ndị ikom ọzọ ndị ga-abụ di unu?1:11 Ajụjụ a bụ nʼihi omenaala ndị Juu, nke bụ, na nwanyị ọbụla na-amụtaghị nwa tupu di ya a nwụọ, na nwanne di ya ga-alụrụ ya. Jen 38:6-8; Dit 25:5-10 12 Laghachinụ azụ ụmụ m. Emeela m agadi ịlụ di ọzọ. A sịkwarị na olileanya fọdụụrụ m ịlụ di na ịmụta ụmụ ndị ikom nʼabalị taa, 13 unu ga-echere ruo mgbe ha tolitere? Unu ga-anọ na-alụghị di ọzọ? Mba, ụmụ m ndị inyom, ọnọdụ m dị ilu karịa nke unu, nʼihi1:13 Nkp 2:15; Job 19:12; Abụ 38:2 na Onyenwe anyị esepụtala aka ya imegide m."

14 Ha welitere olu ha kwaa akwa ọzọ. Mgbe ahụ Ọpa suturu nne di ya ọnụ ma Rut kwusịrị ike nʼebe nọ.

Veja também

Rute
Ver todos os capítulos de Rute