20 Mgbe ahụ Naomi zara nwunye nwa ya sị, "Onye Onyenwe anyị gọziri ka ọ bụ, onye na-ahapụbeghị igosi ebere ya nye ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ. Nwoke a bụ otu nʼime ndị agbụrụ anyị, otu onye nʼime ndị onye mgbapụta anyị."2:20 Onye mgbapụta anyị Onye dị otu a, aghaghị ịbụ onye metụtara nwoke ahụ nwụrụ anwụ. O nwere ike bụrụ nwanne ya maọbụ nwanna ya. Ọ bụ ya ka ọ dịrị dịka iwu ahụ si dị, inwetaghachi maọbụ zụghachite ala niile nke onye ahụ nwụrụ anwụ. Iwu ahụ bụ, na onye mgbapụta a dị nso, ga-alụ nwunye nwanne maọbụ nwanna ya ahụ nwụrụ anwụ, ma ọ bụrụ na ọ mụtaghị nwa. Dit 25:5-10