Pular para o conteúdo
Publicidade

Tiago 3

3 bụrụ na anyị e tinye mkpụmkpụ igwe e ji ekechi ọnụ ịnyịnya ibu nʼọnụ ya, ka o rubere anyị isi, anyị na-eduru ya gaa ebe anyị chọrọ. 4 Otu a kwa, bụladị ụgbọ mmiri buru ibu nke ikuku dị ike na-ebugharị nʼosimiri, ka onye na-anya ụgbọ mmiri pụrụ ime ka gaa ebe chọrọ site nʼịtụgharịa ụmara ntakịrị e ji anya ụgbọ. 5 Otu a ka dịkwa ire anyị. bụ akụkụ anụ ahụ anyị dị nta, ma na-anya isi banyere ọtụtụ ihe. Tulee otu oke ọhịa si dị ukwuu, bụ nke icheku ọkụ dịkarịsịrị nta na-eme ka o nwuru ọkụ. 6 Ire anyị bụ ọkụ. E debere ire nʼetiti akụkụ anụ ahụ ndị ọzọ dịka ụwa ajọ omume. na-emerụ ahụ niile, na-amụnye ọkụ nʼusoro ndụ mmadụ. Ya onwe ya bụkwa ihe ọkụ ala mmụọ na-amụnye ọkụ.

7 Mmadụ enweela ike zụọ, na-agbalịkwa ịzụ anụmanụ dị iche iche, na nnụnụ, na anụ na-akpụ akpụ, na anụ bi na mmiri; 8 ma mmadụ ọbụla adịghị nke nwere ike ịzụ ire. bụ ihe dị oke njọ na-adịghị ekwe nchịkọta, ma jupụtakwa na nsi na-ebute ọnwụ.

Veja também