Pular para o conteúdo
Publicidade

Tito 1

6 ga-abụ onye a na-enweghị ihe ịta ụta, ga-abụ onye na-alụ otu nwanyị. Ụmụ ya bụ ndị kwere ekwe, ndị ama na ha anaghị ebi ndụ ọjọọ, maọbụ na-eme isiike. 7 Ebe bụ na onye nlekọta nʼahụ ihe banyere chọọchị Chineke, ga-abụ onye na-enweghị ihe ịta ụta. gaghị abụ onye nganga, onye na-ewe iwe ọkụ, onye na-aṅụbiga mmanya oke, onye na-alụ ọgụ mgbe niile, onye hụrụ ego nʼanya. 8 ga-abụ onye na-anabata ndị ọbịa, na onye na-ahụ ezi ihe nʼanya. ga-abụ onye na-akwanyere onwe ya ugwu, ezi mmadụ ụzọ ya kwụ ọtọ, onye dị nsọ, na onyeisi zuruoke. 9 ga-abụkwa onye jidesiri oziọma ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi aka ike dịka eziri ya. Nke ga-eme ka o nwe ike gbaa ndị ọzọ ume site na ozizi ahụ nke zuruoke, nakwa ịtụ ndị ahụ na-eguzogide ya mmehie ha nʼihu.

Veja também

Tito
Ver todos os capítulos de Tito