Aliança
A aliança é o modo como Deus se relaciona com seu povo. Da aliança com Noé à Nova Aliança em Cristo, Deus se compromete com amor e fidelidade irrevogáveis.
Alianças com Israel
Deus firmou aliança com Abraão, Moisés e Davi. No arco-íris, na lei, nas promessas — Ele é o Deus da aliança.
Chineke gwara Noa na ụmụ ya sị, "Ugbu a, ana m ehiwe ọgbụgba ndụ nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti agbụrụ unu ndị ga-anọchi unu, na nʼetiti ihe niile nwere ndụ nke unu na ha so, ụmụ anụ ufe, na ụmụ anụ ụlọ, na ụmụ anụ ọhịa niile, ndị ahụ niile so unu si nʼụgbọ mmiri pụta, bụ ihe niile nwere ndụ nʼụwa. Ebe ọ bụ na m ehiwela ọgbụgba ndụ m nʼetiti mụ na unu, ọ gaghị emekwa ọzọ na a ga-eji uju mmiri kpochapụ ihe niile e kere eke, ọ gaghị emekwa ọzọ na a ga-eji uju mmiri bibie ụwa."
Chineke kwuru sị, "Nke a bụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ nke m na-etinye nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti ihe niile nwere ndụ so unu, ọgbụgba ndụ nke ga-adị nye ọgbọ niile na-abịa nʼihu. Etinyela m eke na egwurugwu m na mbara eluigwe, ka ọ bụrụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na ụwa.
Ebe ọ bụ na m ehiwela ọgbụgba ndụ m nʼetiti mụ na unu, ọ gaghị emekwa ọzọ na a ga-eji uju mmiri kpochapụ ihe niile e kere eke, ọ gaghị emekwa ọzọ na a ga-eji uju mmiri bibie ụwa."
Etinyela m eke na egwurugwu m na mbara eluigwe, ka ọ bụrụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na ụwa.
Nʼụbọchị ahụ ka Onyenwe anyị na Ebram gbara ndụ. Ọ sị, "Ndị agbụrụ gị ka m ga-enye ala ndị a, malite nʼiyi ndị Ijipt ruo nʼiyi ukwu Yufretis. Ala ndị Ken, na nke ndị Keniz, na nke ndị Kadmọn, na ala ndị Het, na nke ndị Periz na nke ndị Refaim, na ala ndị Amọrait na nke ndị Kenan na nke ndị Gigash na nke ndị Jebus."
Ebram dara nʼala, kpudo ihu ya nʼala. Chineke gwara ya sị, "Lee, nke a bụ ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na gị. Ị ga-abụ nna ọtụtụ mba. Aha gị agaghị abụkwa Ebram, kama ọ ga-abụ Ebraham, nʼihi na emeela m gị nna nke ọtụtụ mba. Aga m eme gị ka ị mụbaa nke ukwuu. Aga m eme ka ị ghọọ ọtụtụ mba dị iche iche, ndị eze ga-esitekwa na gị pụta. Aga m eme ka ọgbụgba ndụ mụ na gị gbara guzosie ike, ka ọ dịkwara ụmụ ụmụ ndị ga-esote gị nʼọgbọ niile na-abịa. Ọ bụ ọgbụgba ndụ na-egosi na m bụ Chineke gị, na Chineke ụmụ ụmụ gị niile ga-eso gị. Ala Kenan niile, ebe ị nọ ugbu a dịka ọbịa ka m ga-enye gị na ụmụ ụmụ gị ga-esote gị dịka ihe nketa ebighị ebi. Aga m abụ Chineke ha."
Chineke gwara Ebraham okwu sị ya, "Ma nʼebe ị nọ, ị ghaghị irube isi imezu ihe ọgbụgba ndụ m kwuru, gị onwe gị na ụmụ ụmụ gị ndị ga-esote gị, ruo ọgbọ niile. Nke a bụ ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na gị na ụmụ ụmụ gị ndị ga-esote gị, ọgbụgba ndụ nke unu na-aghaghị idebe. A ga-ebi nwoke ọbụla nʼetiti unu ugwu. A ga-ebi unu ugwu, bipụ elu ahụ nke anụ ahụ unu. Nke a ga-abụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na unu.
Nʼafọ nke iri na anọ, eze Kedoloma na ndị eze ya na ha jikọrọ ọnụ buru agha megide ma merie ndị Refaim bi nʼAshterọt Kenaim na ndị Zuzim bi na Ham na ndị Emim bi Kiriatem na Shave,
Nʼihi nke a, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi nke ọma ma debe ọgbụgba ndụ m, unu ga-abụ ihe onwunwe nke m dị oke ọnụahịa. Nʼezie, ụwa niile bụ nke m,
"Aga m etinye oke ala unu site nʼOsimiri Uhie ruo nʼosimiri Mediterenịa, sitekwa nʼọzara ruo nʼosimiri Yufretis. Aga m enyefe ndị niile bi nʼala ahụ nʼaka unu. Unu ga-achụpụkwa ha. Unu na ha agbala ndụ ọbụla. Unu na chi ha enwekwala mmekọ ọbụla.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, "Mụ onwe m na gị na-agba ndụ. Nʼihu ndị gị niile, aga m arụ oke ọrụ ịtụnanya dị ukwu, ụdị nke a na-emetụbeghị mbụ nʼụwa, maọbụ na mba ọ bụla. Ndị niile unu bi nʼetiti ha ga-ahụ ọrụ Onyenwe anyị. Ọrụ ahụ dị oke egwu nke m ga-arụ nʼihi unu.
Mosis na Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị. Ma nʼoge ndị a niile o righị nri ọbụla. Ọ ṅụkwaghị ihe ọṅụṅụ ọbụla. O dere na mbadamba nkume abụọ ahụ okwu niile nke ọgbụgba ndụ ahụ, nke bụ iwu iri ahụ.
Mosis na Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị. Ma nʼoge ndị a niile o righị nri ọbụla. Ọ ṅụkwaghị ihe ọṅụṅụ ọbụla. O dere na mbadamba nkume abụọ ahụ okwu niile nke ọgbụgba ndụ ahụ, nke bụ iwu iri ahụ.
O nyere unu ọgbụgba ndụ ya, nke unu na-aghaghị idebe. Ha dị iwu iri. O dere ha na mbadamba nkume abụọ.
Matanụ nke ọma na Onyenwe anyị bụ Chineke unu bụ Chineke. Ọ bụ Chineke kwesiri ntụkwasị obi, onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya ya ruo puku ọgbọ, nye ndị niile hụrụ ya nʼanya, ndị na-edebe ihe niile o nyere nʼiwu.
Alianças renovadas
O povo renovava a aliança diante do Senhor. A fidelidade de Deus permanece mesmo quando o povo falha.
Ya mere, mgbe ndị Izrel sitere nʼụlọ ikwu ha bilie njem ịgabiga osimiri Jọdan, ndị nchụaja bụ igbe ọgbụgba ndụ buuru ha ụzọ na-aga ha nʼihu. Nʼoge owuwe ihe ubi ọbụla, osimiri Jọdan na-etoju etoju, sọjukwaa akụkụ ya niile. Ma ngwangwa ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ a bịaruru nso zọnye ụkwụ ha nʼọnụ mmiri Jọdan, mmiri si nʼelu elu osimiri ahụ kwụsịrị ịsọ, ọ gara elu tụkọta onwe ya dịka mgbidi nʼebe dị anya, nʼobodo a na-akpọ Adam, nke dị nso obodo Zaretan. Ebe mmiri nke na-eruda na-asọbanye osimiri Araba, ya bụ, osimiri Nnu kwụsịrị ịsọ kpamkpam. Ya mere, ndị Izrel gabigara na ncherita ihu Jeriko. Ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị guzoro nʼala akọrọ nʼetiti Jọdan, Izrel niile gabigakwara tutu ruo mgbe mba ahụ niile gafesịrị nʼala akọrọ.
Jehoiada mere ka ọgbụgba ndụ dị nʼetiti Onyenwe anyị na eze, na ndị mmadụ, na ha ga-abụ ndị nke Onyenwe anyị. O mekwara ka ọgbụgba ndụ dịrị nʼetiti eze na ndị ahụ.
Eze guzoro nʼakụkụ ogidi, kwee nkwa nʼihu Onyenwe anyị, ịgbaso Onyenwe anyị, na iji obi ya niile, na mkpụrụobi ya niile, debe ihe niile o nyere nʼiwu, nʼihe ama ya niile na ụkpụrụ ya niile. O si otu a mee ka okwu niile nke ọgbụgba ndụ ahụ e dere nʼakwụkwọ guzosie ike. Mgbe ahụ, ndị mmadụ niile kwekwara nkwa idebe ọgbụgba ndụ ahụ.
Ya mere, eze Joram sitere na Sameria pụọ ga kpọkọta ndị Izrel niile. O zigara Jehoshafat eze Juda ozi sị ya, "Eze Moab enupula isi megide m. Ị ga-abịa soro m ịga buso ndị Moab agha?"
Ọ zaghachiri, "Aga m eso gị gaa. Mụ na gị bụ otu, ndị m bụ ndị gị, ịnyịnya m bụkwa ịnyịnya gị."
Jonatan na ụlọ Devid gbara ndụ. O kwuru sị, "Ka Onyenwe anyị kpee ndị iro Devid niile ikpe." Jonatan mere ka Devid site nʼịhụnanya ọ hụrụ ya ṅụọra ya iyi. Nʼihi na Jonatan hụrụ Devid nʼanya dịka ọ hụrụ onwe ya.
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, "Finehaz nwa Elieza, nwa Erọn, onye nchụaja, emeela ka iwe m megide Izrel dajụọ. Nʼihi na o nwere ịnụ ọkụ nʼobi dịka mụ onwe m banyere idebe nsọpụrụ m nsọ nʼetiti ha, ka m ghara isite nʼịnụ ọkụ nke obi m bibie ha. Ya mere, gwa ya, na m na-eme ka ọgbụgba ndụ udo m dịrị ya. Ya na ụmụ ụmụ ya ka ọgbụgba ndụ ebighị ebi nke ịrụ ọrụ nchụaja ga-adịrị, nʼihi na o nwere ịnụ ọkụ nʼobi banyere nsọpụrụ nke Chineke ya, si otu a chụọrọ ndị Izrel aja ikpuchi mmehie."
Mgbe Mosis banyere nʼụlọ ikwu ahụ ka ya na Onyenwe anyị kparịa ụka, ọ nụrụ olu ahụ ka ọ na-agwa ya okwu site nʼetiti cherubim abụọ ndị ahụ nʼelu ebe mkpuchi mmehie dị nʼelu igbe iwu ọgbụgba ndụ gwa ya okwu. Nʼụzọ dị otu a ka Onyenwe anyị si gwa ya okwu.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, "Gwa ụmụ Izrel okwu, sitekwa nʼaka ha nata mkpanaka iri na abụọ otu mkpanaka nʼisi onyendu nke ebo ọbụla. Dekwasị aha onyendu ọbụla nʼahụ mkpanaka nke ya. Ma nʼelu mkpanaka Livayị dekwasị aha Erọn. A ga-enwe otu mkpanaka maka onyendu ebo ọbụla. Tinye mkpanaka ndị a niile nʼime ụlọ nzute, nʼihu Ihe Ama ahụ, ebe m na-ezute gị. Mkpanaka nke onye ahụ m họpụtara ga-ama ifuru ndụ. M ga-ewezugakwa ntamu niile nke ndị Izrel site nʼebe m nọ, bụ nke ha na-atamu megide unu."
Ya mere, Mosis gwara ndị Izrel okwu ndị a. Ndị ndu ha nyere ya mkpanaka iri na abụọ, otu mkpanaka nʼisi otu onyeisi maka onyeisi ebo ha nʼotu nʼotu. Mkpanaka Erọn dịkwa nʼetiti nke ha. Mosis chịịrị ha niile dozie ha nʼihu Onyenwe anyị nʼime ime ụlọ nzute Ihe Ama ahụ.
Nʼechi ya, Mosis banyere nʼụlọ nzute Ihe Ama ahụ chọpụta na ọ bụghị naanị na mkpanaka Erọn, onye nọchitere anya ebo Livayị, amaala ifuru, kama na ọ waala okoko ma mịakwa mkpụrụ osisi chara acha a na-akpọ alụmọnd. Mgbe ahụ, Mosis sitere nʼihu Onyenwe anyị wepụta mkpanaka ndị ahụ niile gosi ha ndị Izrel niile. Ha hụrụ ha, ma nwoke ọbụla weghachiri mkpara osisi nke ya.
Onyenwe anyị gwara Mosis sị, "Tinye mkpanaka Erọn nʼihu Ihe Ama ahụ, ka ọ dịgide nʼebe ahụ dịka ihe ama nye ndị nnupu isi. Nke a ga-eme ka ntamu ndị a megide m kwụsị, ka ha ghara ịnwụ." Ya mere, Mosis mezuru ihe niile dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
Ụmụ Izrel bidoro ime ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị. Ya mere, Onyenwe anyị nyefere ha nʼaka Eglọn, eze Moab. Ọ kpọtara ndị Amọn, ebe ndị Amalek si nʼagbụrụ Ịsọ (ị ga-agụta nke a nʼakwụkwọ Jen 36:12,16). Ọ bụghị naanị na ha bụ ndị agbataobi ndị Izrel, ma ha bụ ndị iro ka ndị iro niile nke ndị Izrel nwere (gụọ Dit 25:17-18). na ndị Amalek ka ha dịnyere ya. Eglọn bịara buso ndị Izrel agha, nweta obodo Nkwụ, ya abụrụzia nke ha.
Nova Aliança
Eis que dias vêm em que farei nova aliança. Jesus é mediador de uma aliança superior, fundamentada em melhores promessas.
"Lee, oge na-abịa," ka Onyenwe anyị kwupụtara,
"mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrị
nʼetiti mụ na ụlọ Izrel,
nakwa ụlọ Juda.
Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ ahụ
mụ na nna nna ha gbara,
mgbe ahụ m jidere ha nʼaka
site nʼala Ijipt dupụta ha,
nʼihi na ha mebie ọgbụgba ndụ m,
ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ di nye ha,"
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
"Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ụlọ Izrel ga-agba
mgbe oge ndị ahụ gasịrị," ka Onyenwe anyị kwupụtara.
"Aga m etinye iwu m nʼime obi ha,
aga m edekwasịkwa ha nʼuche ha.
Aga m abụ Chineke ha,
ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.
Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe,
maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara Onyenwe anyị,’
nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ,
site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu nʼetiti ha."
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
"Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha,
agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ."
"Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ọ bụrụ na unu nwere ike ime ka ọgbụgba ndụ m na ehihie, na ọgbụgba ndụ mụ na abalị ghara ịdịkwa, ime ka ehihie na abalị gharakwa ịpụta nʼoge ha, mgbe ahụ ọgbụgba ndụ nke mụ na Devid ohu m gbara, na ọgbụgba ndụ nke m mere ka ọ dịrị nʼetiti mụ na ndị Livayị, bụ ndị nchụaja na-eje ozi ha nʼihu m, agaghị adịkwa. A gaghị enwekwa onye ga-esi nʼezinaụlọ Devid nke ga-anọkwasị nʼocheeze ya.
Nʼihi nke a, ọ bụ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, ka ndị a kpọrọ site na ya nata ihe nketa ebighị ebi ahụ bụ nke e kwere ha na nkwa. A pụrụ ime nke a nʼihi ọ nwụọla ọnwụ gbapụta ụmụ mmadụ site nʼikpe ọmụma nke mmehie ha mere nʼokpuru ọgbụgba ndụ nke mbụ ahụ.
Nʼihi nke a, ọ bụ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, ka ndị a kpọrọ site na ya nata ihe nketa ebighị ebi ahụ bụ nke e kwere ha na nkwa. A pụrụ ime nke a nʼihi ọ nwụọla ọnwụ gbapụta ụmụ mmadụ site nʼikpe ọmụma nke mmehie ha mere nʼokpuru ọgbụgba ndụ nke mbụ ahụ.
Ma otu ọ dị, ọ natara ọrụ ije ozi karịrị nke ha, dị ka onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ dị elu karịa nke ochie, ebe ọgbụgba ndụ nke ọhụrụ a o mere ka ọ dịrị nʼetiti ya na mmadụ dabeere na nkwa dị mma karịa.
Ugbu a ka Chineke nke udo, onye ahụ sitere nʼọbara ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ kpọghachite Onyenwe anyị Jisọs, Onye ọzụzụ atụrụ ukwuu ahụ, site nʼọnwụ, mee ka unu zuo oke nʼezi ihe ọma niile ọbụla, nke ga-enyere unu aka ime ihe ọ na-achọ. Ka ọ rụpụta nʼetiti anyị ihe ndị ahụ niile na-atọ ya ụtọ site na Jisọs Kraịst, onye otuto niile dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
Onye mere ka anyị zuo oke ịbụ ndị ozi ya nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, nke edeghị nʼakwụkwọ iwu kama nʼime Mmụọ. Ihe e dere nʼakwụkwọ iwu na-eweta ọnwụ, ma Mmụọ na-enye ha ndụ.
Anyị ga-ewere ihe ndị a dị ka ihe ịmaatụ, nʼihi na ụmụ nwanyị abụọ ndị a nọchiri anya ọgbụgba ndụ abụọ. Otu ọgbụgba ndụ sitere nʼUgwu Saịnaị ma mụọkwa ụmụ ndị bụ ohu: nke a bụ Hega. Hega bụ Ugwu Saịnaị nke dị nʼArebịa. Ọ dabara nʼọnọdụ Jerusalem nke ugbu a, nʼihi na ya na ụmụ ya nọ nʼohu. Ma nwanyị nke ọzọ nọ ọnọdụ Jerusalem nke dị nʼelu, nke nwe onwe ya. Ọ bụkwa ya bụ nne anyị.
Fidelidade da aliança
A aliança de Deus é eterna. Ele não quebra seu pacto nem altera o que saiu dos seus lábios.
Ma ịhụnanya Onyenwe anyị na-adịgide site
nʼebighị ebi ruo ebighị ebi nʼetiti ndị na-atụ egwu ya.
Ezi omume ya na-adịgidekwara ụmụ ụmụ ha,
nye ndị ahụ niile na-edebe ọgbụgba ndụ ya
na ndị na-echeta irubere ụkpụrụ ya isi.
"Ma mụ onwe m, nke a bụ ọgbụgba ndụ m nke dị nʼetiti mụ na ha," ka Onyenwe anyị na-ekwu. "Mmụọ m, nke dị nʼahụ gị, na okwu m niile nke m tinyere nʼọnụ gị, agaghị apụ nʼegbugbere ọnụ gị, maọbụ nʼegbugbere ọnụ ụmụ gị, maọbụ nʼegbugbere ọnụ agbụrụ gị. Ha ga-adịgide site ugbu a ruo mgbe niile ebighị ebi," ka Onyenwe anyị kwuru.
" ‘Mụ na ha ga-agba ndụ udo. Aga m achụpụkwa anụ ọjọọ niile nʼala ha, ka ndị m nwee ike ibi nʼudo nʼọzara, ma rahụkwa ụra ọ bụladị nʼetiti oke ọhịa nʼenweghị nsogbu.
Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-eburu gị ụzọ, ọ ga-anọnyekwara gị, ọ gaghị ahapụ gị maọbụ gbakụta gị azụ. Atụla egwu, adala mba."
Ya na ọtụtụ ndị mmadụ ga-enwe ọgbụgba ndụ nʼotu ‘izu ụka,’ ọ bụkwa nʼọkara izu ụka ahụ, ka ọ ga-eme ka ịchụ aja na inye onyinye kwụsị. Ọ ga-emekwa ihe arụ dị egwu nʼime ụlọnsọ ahụ, ruo mgbe a ga-awụkwasị ya ọgwụgwụ ahụ bụ nke akara aka nʼahụ onye ọjọọ ahụ."
"Eze nke ndịda ga-adị ike, ma otu onye nʼime ndịisi agha ya ga-adị ike karịa ya, chịakwa alaeze dị ukwu karịa nke ya Mgbe afọ ole na ole gasịrị, ha ga-ekekọta onwe ha. Ada eze ndịda ga-agakwuru eze ugwu ka ha gbaa ndụ, ma ada eze agaghị ejigide ike ya, eze na ike ya agaghị adịgidekwa. Nʼụbọchị ndị ahụ, a ga-arara ada eze ahụ nye, ya na ndị na-eche ya nche, na nna ya na onye ahụ dịnyeere ya.
Ma onye nke na-ebuso ya agha ga-eme ihe masịrị ya, ma o nweghị onye ga-egbochi ha. Ọ ga-abatakwa nʼAla Ọma ahụ, ebe ihe niile ga-anọ nʼokpuru ya. Ọ ga-ekpebi ịbịa nʼike nke alaeze ya niile, iji mee nke a, ya na eze nke ndịda ga-agba ndụ. Ọ ga-enyekwa ya nwaagbọghọ iji kwatuo alaeze ya, ma ebumnobi ya agaghị eguzo maọbụ baara ya uru.
"Mụ na anya m gbara ndụ kpebie
na o nweghị mgbe m ga-ele nwaagbọghọ ọbụla anya nʼihi agụụ ịkwa iko.
Ọ bụ naanị amamihe ga-anapụta gị nʼaka nwanyị akwụna,
na nwanyị na-abụghị nwunye gị nke na-ekwu okwu nrafu.
Onye na-ahapụ di ọ lụrụ nʼagbọghọ,
nke chefuru ọgbụgba ndụ ọ gbara nʼihu Chineke.