Pular para o conteúdo
Publicidade

Amigo

Por Bíblia Online

O amigo verdadeiro é dádiva rara de Deus. Ele ama em todo tempo, fala a verdade em amor, aconselha com sabedoria e permanece fiel nas adversidades da vida.

Amizade verdadeira

Há amigo mais chegado que um irmão. Em todo tempo ama o amigo. O perfume e o incenso alegram o coração — assim o conselho doce do amigo.

Onye nwere ọtụtụ ndị enyi ndị na-ekwesighị ga-abịa nʼịla nʼiyi mgbe na-adịghị anya,

ma dị enyi nke na-arapara nso karịa nwanne.

Ezi enyi na-egosi ịhụnanya ya nʼoge ọbụla.

Otu a kwa, nwanne na-aba uru nʼoge mkpa.

Mmanụ isi ụtọ na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-eme ka obi ṅụrịa,

otu a ka ụtọ enyi dị,

site na ndụmọdụ nke mkpụrụobi ha.

Dịka e si eji igwe amụ igwe ọzọ ka dị nkọ,

otu a ka mmadụ si enyere ibe ya aka ịdị nkọ.

Mba abara nʼihe ka mma

karịa ịhụnanya ezoro ezo.

Ihe kwesiri ntụkwasị obi ka mmerụ ahụ nke sitere nʼaka enyi bụ,

ma onye iro na-eme ka isutu ọnụ mụbaa.

Ahapụla enyi gị maọbụ ndị enyi nna gị.

Mgbe nọ na mkpa arịọla nwanne gị ka o nyere gị aka.

Onye agbataobi nọ gị nso nwere ike inyere gị aka karịa nwanne gị nọ ebe dị anya.

Na-eso ndị maara ihe ka ghọọ onye mara ihe,

nʼihi na onye na-eso ndị nzuzu na-aba na nsogbu.

Okwu nke atọ

Gị na onye na-ewe oke iwe abụla enyi,

gị na onye na-ewe iwe ọsịịsọ emekọkwala ihe,

ma bụghị ya, i nwere ike ịmụta ndụ ha,

si otu a tinye ndụ gị na nsogbu.

Ọtụtụ mmadụ na-asị na ha nwere ịhụnanya na-adịghị agharịpụ,

ma onye kwesiri ntụkwasị obi, onye pụrụ ịchọta ya?

Onye nwere ego na-enwe ọtụtụ ndị enyi,

ma na-ara ahụ ka ndị enyi onye ogbenye nọgide.

Jesus, o amigo

Já não vos chamo servos, mas amigos. O maior amor é dar a vida pelo amigo. Jesus é o amigo que nunca falha.

dịghị onye ọbụla nwere ịhụnanya karịrị nke a na mmadụ tọgbọrọ ndụ ya nʼihi ndị enyi ya. Unu onwe unu bụkwa ndị enyi m ma bụrụ na unu edebe ihe m nyere nʼiwu. Anaghị m akpọkwa unu ndị ohu ọzọ. Nʼihi na ohu adịghị amatazu ihe niile onyenwe ya na-eme. Ma ana m akpọ unu ndị enyi m nʼihi na agwala m unu ihe niile m nụrụ nʼọnụ Nna m.

Nke a bụkwa iwu m, ka unu hụrịta onwe unu nʼanya dị ka m siri hụ unu nʼanya. dịghị onye ọbụla nwere ịhụnanya karịrị nke a na mmadụ tọgbọrọ ndụ ya nʼihi ndị enyi ya.

Ndị m hụrụ nʼanya, ebe bụ na Chineke si otu a hụ anyị nʼanya, anyị kwesiri ịhụrịta onwe anyị nʼanya. O nwebeghị mgbe ọbụla anyị ji anya anyị hụ Chineke anya, ma bụrụ na anyị ahụ ibe anyị nʼanya, Chineke na-ebi nʼime anyị. A na-emekwa ka ịhụnanya ya zuo oke nʼime anyị.

bụ otu a ka anyị sị mata ihe bụ ịhụnanya, na Jisọs tọgbọrọ ndụ ya nʼihi anyị. Anyị kwesikwara ịtọgbọ ndụ anyị nʼihi ụmụnna anyị. bụrụ na onye ọbụla nwere akụ nke ụwa, ahụ nwanna ya ka nọ na mkpa ma o nweghị obi ebere nʼebe nọ, olee otu ịhụnanya Chineke si dịrị nʼime ya? Ụmụntakịrị m, ka ịhụnanya anyị ghara ịbụ naanị nʼegbugbere ọnụ maọbụ nke okwu efu, kama ka bụrụ nke sitere nʼeziokwu nakwa nʼomume anyị.

bụ site na nke a ka ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ jiri mezuo, nke na asị, "Ebraham kweere na Chineke, a gụrụ nke a nye ya dị ka ezi omume," kpọọkwa ya enyi Chineke.

Hụrịtanụ onwe unu nʼanya, dịka ụmụ nke otu nna. Ka ihe ibe unu na-eme na-atọ unu ụtọ. Na-asọpụkwaranụ ibe unu karịa otu ha si asọpụrụ unu.

Companheiros de fé

Dois são melhores do que um. Os companheiros de fé se fortalecem mutuamente e caminham juntos com o Senhor.

Mmadụ abụọ ka mma karịa otu onye,

nʼihi na ha ga-arụpụta ọtụtụ ihe:

Otu onye nʼime ha daa,

onye nke ọzọ ga-apalite ya.

Ma mgbe bụ naanị otu onye,

onye ga-apalite ya? nọ nʼime nsogbu.

Ngọzị nke ibi nʼotu

Lee ka o si bụrụ ihe dị mma

na ihe ọṅụ mgbe ụmụnne na-ebikọ nʼotu!

dị ka mmanụ dị oke ọnụahịa a wụrụ nʼisi,

nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ,

e, nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ Erọn,

ruokwa nʼolu uwe mwụda ya.

dị ka a ga-asị na igirigi si na Hemon

na-ada nʼelu nʼugwu Zayọn.

Nʼihi na nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị na-enye onyinye ngọzị ya,

bụladị ndụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi.

Abụ m enyi ndị niile na-atụ egwu gị,

ndị niile na-agbaso ụkpụrụ gị.

Jonatan na Devid gbara ndụ nʼihi na Jonatan hụrụ Devid nʼanya dịka o si hụ onwe ya.

Unu ekwela ka e duhie unu. Nʼihi na mkparịkọta agwa ọjọọ na-emebi ezi agwa.

Seja o primeiro