Pular para o conteúdo
Publicidade

Salmos 133

Abụ nrigo, nke Devid.

Ngọzị nke ibi nʼotu

1 Lee ka o si bụrụ ihe dị mma

na ihe ọṅụ mgbe ụmụnne na-ebikọ nʼotu!133:1 Hib 13:1

2 dị ka mmanụ dị oke ọnụahịa a wụrụ nʼisi,

nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ,

e, nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ Erọn,

ruokwa nʼolu uwe mwụda ya.

3 dị ka a ga-asị na igirigi si na Hemon

na-ada nʼelu nʼugwu Zayọn.

Nʼihi na nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị na-enye onyinye ngọzị ya,

bụladị ndụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi.

Veja também