Amor de casal
O amor de casal é celebrado na Bíblia como dom sagrado. O Cântico dos Cânticos exalta a beleza do amor conjugal — íntimo, exclusivo e forte como a morte.
Tụkwasị m dịka mgbaaka ihe a kara nʼobi,
dịka mgbaaka ihe a kara nʼaka gị
nʼihi na ịhụnanya dị ike dịka ọnwụ,
ekworo ya dịkwa ike dịka ala mmụọ.
Ọ na-enwupụtakwa dịka ọkụ na-ere ere,
dịka ọkụ nke dị ukwu.
Ọtụtụ mmiri apụghị imenyụ ịhụnanya,
osimiri niile enwekwaghị ike iri ya.
Ọ bụrụ na mmadụ ga-enye
akụ niile nke ụlọ ya nʼihi ịhụnanya,
a ga-eleda ya anya nke ukwuu.
Ndị Enyi
I riela m obi, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m;
i riela m obi,
i werela ile anya gị
na ihe olu i yi rie obi m.
Ya were nsusu niile nke ọnụ ya susuo m ọnụ,
nʼihi na ịhụnanya gị dị ụtọ karịa mmanya.
Mmanụ otite gị niile na-esi isi ọma,
aha gị dịka mmanụ isi ụtọ awụpụtara awụpụta,
ọ bụghị ihe ịtụnanya na ụmụ agbọghọ hụrụ gị nʼanya.
Nʼezie, ị mara mma, onye m hụrụ nʼanya.
Leenụ ka ị si maa mma!
Anya gị dịka nduru.
Onye a hụrụ nʼanya
Onye m hụrụ nʼanya, ị mara mma nwoke.
E, ị mara mma.
Ebe ndina anyị dịka ahịhịa ndụ.
Onye hụrụ ibe ya nʼanya
Onyenwe anyị Chineke kwuru sị, "Ọ dịghị mma ka nwoke nọrọ naanị ya. Aga m emere ya onye inyeaka nke kwesiri ya."
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị Chineke ji otu ọgịrịga o si nʼahụ nwoke ahụ wepụta, mee nwanyị, dutere ya nwoke ahụ.
Nwoke ahụ kwuru sị,
"Nke a bụ ọkpụkpụ si nʼọkpụkpụ m,
na anụ ahụ si nʼahụ m,
a ga-akpọ ya ‘nwanyị,’
nʼihi na e si nʼime nwoke wepụta ya."
Ọ bụ nke a mere nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya, e jikọta ya na nwunye ya, ha ga-abụ otu anụ ahụ.
Nwoke ahụ chọtara nwunye chọtara ezi ihe.
Ọ na-anatakwa ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị.
Kwere ka ịbụ nwoke gị bụrụ ngọzị nye gị;
ṅụrịakwa ọṅụ nʼihi nwunye nke ị lụtara nʼokorobịa gị.
Nne anụ nke na-ahụ nʼanya, dịka ele mara mma,
ka ara dị ya nʼobi zuore gị,
ka ịhụnanya ya na-enye gị obi ụtọ mgbe ọbụla.
Gịnị ka ị na-achọ nʼahụ nwanyị na-akwa iko?
Gịnị mere i ji na-amaku nwunye onye ọzọ obi?
Ya mere, ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ, kama otu anụ ahụ. Ya mere, ihe Chineke jikọtara, ka mmadụ ọbụla atọsala ya."
Ịhụnanya na-enwe ogologo ntachiobi, na-enwekwa obi ebere. Ọ dịghị ekwo ekworo, ọ naghị enwe anya ukwu, ọ naghị anya isi. Ọ nakwaghị ebuli onwe ya elu. Ọ naghị eme ihe na-akpasu iwe, ọ naghị achọ ihe nke naanị ya, ọ naghị ewe iwe ọsịịsọ. Ọ nakwaghị agụkọ ihe ọjọọ niile e mere ya. Ọ dịghị aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ, kama ọ na-aṅụrị nʼeziokwu. Ọ na-edi ihe niile, ọ na-ekwerekwa ihe niile, ọ na-enwekwa olileanya na-anagide ihe ọbụla dapụtara.
Nʼotu ụzọ ahụ kwa, ndị bụ di kwesiri ịhụ nwunye ha nʼanya dị ka ha si hụ anụ ahụ ha nʼanya. Nʼihi na onye ọbụla hụrụ nwunye ya nʼanya na-ahụ onwe ya nʼanya. Ọ dịghị onye ọbụla nke kpọrọ anụ ahụ ya asị. Kama, ọ na-azụ ya na-edozikwa ya, dị ka Kraịst na-emere chọọchị.
Ma otu ọ dị, onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịhụ nwunye ya nʼanya dị ka ọ hụrụ onwe ya, nwunye ọbụla aghakwaghị ịsọpụrụ di ya.
Nke kachasị nke, kwerenụ ka ịhụnanya na-achị achị na ndụ unu, nʼihi na ọ bụ nke a na-ejikọta ihe niile nʼotu.
Mmadụ abụọ ka mma karịa otu onye,
nʼihi na ha ga-arụpụta ọtụtụ ihe:
Otu onye nʼime ha daa,
onye nke ọzọ ga-apalite ya.
Ma mgbe ọ bụ naanị otu onye,
onye ga-apalite ya? Ọ nọ nʼime nsogbu.
Ọzọ, ọ bụrụ na mmadụ abụọ edinakọ, ahụ ga-ekpokwa ha ọkụ,
ma olee otu onye naanị ya dina ga-esi nweta okpomọkụ?
Ọ bụ ezie na e nwere ike merie onye naanị ya guzo,
ma mmadụ abụọ pụrụ iguzo zọọ onwe ha.
Ụdọ e ji eriri atọ tụkọta nʼotu, adịghị adọbi ya ngwangwa.
Ọ bụ na ọ bụghị otu Chineke ahụ kere gị? Nʼanụ ahụ na nʼime mmụọ, unu bụ nke ya. Ma gịnị ka otu Chineke a chọrọ? Ka unu bụrụ ụmụ na-atụ ya egwu. Ya mere, jie mmụọ gị aka, ka ị gharakwa ịbụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼebe nwunye ị lụtara nʼokorobịa nọ.
Nwoke ọbụla lụrụ nwunye ọhụrụ agaghị apụ soro ndị agha, maọbụ soro rụọ ọrụ ọzọ pụrụ iche, otu afọ ka ọ ga-enwere onwe ya ịnọ nʼụlọ ya, ya na nwunye ya, ime onwe ha obi ụtọ.