Amor próprio
O amor próprio saudável reconhece o valor que Deus nos deu. Fomos criados à imagem de Deus, maravilhosamente formados. Aceitar-se é honrar o Criador.
Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee;
ọrụ gị niile dị ebube;
amaara m nke a nke ọma.
Lee ka echiche ị na-eche banyere m si dị oke ọnụahịa, o Chineke!
Leekwa ka ha si dị ukwuu.
Ọ bụrụ na m agụọ ha ọnụ,
ha ga-adị ukwuu karịa ọnụọgụgụ aja dị nʼala.
Mgbe m tetara, mụ na gị ka nọ.
Mgbe ọbụla m lere anya na mbara eluigwe,
hụ ọrụ niile nke aka gị rụrụ,
mgbe m lere anya nʼelu hụ ọnwa na kpakpando
i tinyere nʼọnọdụ ha,
gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha?
Gịnịkwa ka mmadụ bụ iji na-elekọta ha?
I mere ka ha dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi nọ,
I jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze.
Ọ na-esi nʼuzuzu bulie ogbenye elu
sitekwa nʼebe ikpofu ahịhịa bulie onye nọ na mkpa elu;
ọ na-eme ka ya na ụmụ eze ndị ikom nọkọọ,
ọ na-eme ka o soro ndị a maara aha ha nʼetiti ụmụ mmadụ nọkọọ.
Ma Onyenwe anyị zara Samuel sị ya, "Ejila ihu mmadụ maọbụ ito ogologo ya ekpebi, nʼihi na onye a abụghị ya. Onyenwe anyị adịghị ahụ ihe dịka mmadụ si ahụ. Mmadụ na-ele anya nʼelu ahụ, ma Onyenwe anyị na-ele anya nʼobi."
Ma unu bụ ndị a họpụtara, otu ndị nchụaja eze, mba dị nsọ, ndị nke Chineke nʼonwe ya, ka unu bụrụ ndị na-ekwusa otuto ya, bụ onye ahụ si nʼọchịchịrị kpọbata unu nʼìhè ya dị ebube.
Ọ bụghị mkpụrụ ego abụọ ka a na-ere ụmụ nza ise? Ma o nweghị nke ọbụla nʼime ha Chineke chefuru. Nʼezie a gụrụ ọ bụladị agịrị isi dị nʼisi unu ọnụ. Unu atụla egwu, nʼihi na unu dị oke ọnụ karịa ọtụtụ ụmụ nza.
Ọrụ obi umeala
Dịka onyinye amara e nyere m siri dị, ana m adọ onye ọbụla nʼime unu aka na ntị sị, Unu atụkwasịla uche nʼechiche banyere onwe unu karịa ka o si kwesi. Kama, jirinụ obi dị umeala lee onwe unu anya dịka okwukwe Chineke nyere unu ha.