Pular para o conteúdo
Publicidade

Salmos 8

Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid nʼusoro gittit.

Ịdị ebube Chineke na nsọpụrụ nke mmadụ

1 O Onyenwe anyị Onyenwe anyị,

lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile!

I meela ka ebube gị dị elu

nʼime eluigwe.

2 Site nʼotuto8:2 Mat 21:16 ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara,

tọọla ntọala siri ike megide ndị iro gị,

ka e si otu a mechie ọnụ onye iro na onye ahụ na-abọ ọbọ.

3 Mgbe ọbụla m lere anya na mbara eluigwe,

hụ ọrụ niile nke aka gị rụrụ,

mgbe m lere anya nʼelu hụ ọnwa na kpakpando

i tinyere nʼọnọdụ ha,

4 gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha?

Gịnịkwa ka mmadụ bụ iji na-elekọta8:4 Gịnị ka nwa nke mmadụ bụ na ihe banyere ya na-emetụ gị nʼobi ha?

5 I mere ka ha8:5 Maọbụ, ya dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi8:5 Maọbụ, Chineke nọ,

I jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze.

6 I mekwaala ya ka bụrụ onyeisi nke ihe niile i kere eke,

tinyekwa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.

7 na-achị igwe ewu na atụrụ, na ehi,

na ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ niile,

8 na nnụnụ niile,

na azụ niile,

na anụ ndị ọzọ na-ebi nʼime mmiri.

9 O Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,

lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile.

Veja também