Publicidade

Ânimo

Por Bíblia Online

O ânimo vem de Deus. Ele nos fortalece, nos encoraja e renova nossas forças. Quando o desânimo chega, as promessas de Deus nos levantam e nos impulsionam a seguir em frente.

Abụ nke iguzosi ike

Onyenwe anyị bụ ìhè m na nzọpụta m,

onye ka m ga-atụ egwu ya?

Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m,

bụkwa onye ka m ga-atụ egwu?

Nzọpụta nke ndị ezi omume si nʼaka Onyenwe anyị bịa;

bụ ebe ha e wusiri ike nʼoge nsogbu.

Mgbe m kpọkuru gị, zara m;

i mere m ka m nwee nkwuwa okwu ma guzosiekwa ike.

Nʼihi na apụrụ m ime ihe niile site nʼinyeaka onye na-enye m ike.

Amaara m nʼezie, na onye ahụ malitere ọrụ ọma nʼime unu, ga-aga nʼihu ịrụzu ya ruo ụbọchị Kraịst Jisọs.

Nʼihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ ịtụ ụjọ, kama o nyere anyị mmụọ na-emejupụta anyị nʼike, na ịhụnanya, na uche zuruoke.

Nʼihi na mụ onwe m maara echiche niile m na-eche banyere unu," ka Onyenwe anyị kwubiri, "echiche ime ka ihe gaara unu nke ọma, bụkwaghị echiche ime unu ihe ọjọọ, echiche ime ka unu nwee ezi ọdịnihu, na olileanya kwesiri ntụkwasị obi.

Ndị Izrel niile zara sị ya, "O nweghị ihe ga-eme ka anyị hapụ Onyenwe anyị fee chi ndị ọzọ! bụ Onyenwe anyị Chineke anyị, ya onwe ya si nʼala Ijipt, ebe anyị bụ ndị ohu, kpọpụta anyị na nna anyị ha. rụrụ ọrụ ịrịbama ndị ahụ niile dị oke egwu nʼihu anyị. O chebere anyị nʼije anyị niile nʼetiti mba ndị ahụ niile anyị si nʼala ha gafee.

Nʼime ihe ndị a ka unu na-aṅụrị oke ọṅụ, bụ ezie na nʼoge ndị a dị nta, unu agabigala ọtụtụ ihe mgbu nʼihi ụdị ọnwụnwa dị iche iche bịakwasịrị unu.

na-agụ m agụụ nke ukwuu ịbịa hụ unu anya, nʼihi na achọrọ m ka unu keta oke nʼonyinye Mmụọ Nsọ nke Chineke nyere m, nke ga-enyere unu aka iguzosi ike nʼokwukwe. bụkwaghị naanị nke a, kama achọrọ m ka anyị gbarịtaa onwe anyị ume site nʼokwukwe anyị.

bụ nke a mere ike adịghị agwụ anyị nʼobi. bụ ezie na anụ ahụ anyị na-anwụ anwụ, ma a na-agba mmụọ anyị ume kwa ụbọchị.

Ya mere, na-akasịrịtanụ onwe unu obi. Na-emekwanụ ihe ọbụla ga-ewuli ibe unu elu dị ka unu si eme.

Nʼihi nke a, ụmụnna anyị, anyị abụrụla ndị a gbara ume nke ukwuu, bụladị nʼime mkpagbu niile nke anyị nọ nʼime ya, nʼihi iguzosi ike nke unu guzoro nʼokwukwe unu.

Seja o primeiro
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-