Aniversário de idoso
O aniversário de um idoso é celebração de uma vida longa e cheia de experiências com Deus. A Bíblia honra os cabelos brancos como coroa de glória e prova da fidelidade divina.
Ekele maka Chineke onye na-anapụta
Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma;
ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Nke a bụ ụbọchị Onyenwe anyị anyị mere,
ka anyị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime ya.
Chineke dị mma
Aga m eto Onyenwe anyị mgbe niile.
Mgbe niile ka otuto ya ga-adị nʼọnụ m.
Onyenwe anyị bụ ike m na ọta m;
ana m atụkwasị ya obi m, si otu a bụrụ onye a na-enyere aka.
Obi m na-awuli elu nʼihi ọṅụ,
aga m ejikwa abụ m na-eto ya.
Were ọṅụ mejupụta obi m
karịa mgbe mkpụrụ ubi, ya na mmanya ọhụrụ ha bara ụba nke ukwuu.
I gosila m ụzọ ndụ;
ị ga-eji ọṅụ mejupụta obi m nʼihu gị;
ya na ihe ụtọ ndị dị nʼaka nri gị ruo ebighị ebi.
Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka Onyenwe anyị,
nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike;
ka m biri nʼụlọ Onyenwe anyị
ụbọchị niile nke ndụ m,
na ka m lekwasị ịma mma Onyenwe anyị,
na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya.
Kuziere anyị ịgụ ụbọchị niile nke ndụ anyị ọnụ,
ka anyị si otu a nweta obi amamihe jupụtara.
Isi awọ bụ okpueze nke mara mma,
a na-enweta ya nʼụzọ ezi omume.
Ugwu a na-akwanyere ụmụ okorobịa bụ nʼihi ịdị ike ha,
ma isi awọ bụ nsọpụrụ ndị okenye.
ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị,
ga-agbanwe ike ha, nweta ike ọhụrụ.
Ha ga-eji nku felie elu dịka ugo.
Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha;
ha ga-aga ije ma ha agaghị ada mba.
"Ugbu a, dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa, o meela ka m dị ndụ. Nke a bụ iri afọ anọ na ise kemgbe Onyenwe anyị gwara Mosis okwu ndị a, mgbe Izrel na-awagharị nʼọzara. Ma ugbu a, lee, agbaala m iri afọ asatọ na ise taa. M dị ike taa dịka m dị nʼụbọchị ahụ Mosis zipụrụ m. Dịka ike m dị mgbe ahụ, adịkwa m ike ugbu a, ịpụ buo agha ma batakwa
" ‘ "Onyenwe anyị gọzie unu
ma chebe unu,
Onyenwe anyị mee ka ihu ya mụkwasị unu,
ma meere unu amara,
Onyenwe anyị chee ihu ya nʼebe unu nọ,
nyekwa unu udo." ’
Onye m hụrụ nʼanya, ekpere m bụ na ahụ ga-esi gị ike, ka ihe na-agara gị nke ọma, dịka ọ na-agara mkpụrụobi gị nke ọma.